Ọlu Ndi-Ozi 26:1-14 Bible Nso (IGBOB)

1. Agripa we si Pọl, Ekwere ka i kwuere onwe-gi okwu. Mb͕e ahu Pọl setiri aka-ya, we gọpu onwe-ya, si:

2. Eze Agripa, agurum onwem n'onye ngọzi diri, na agajem igọpu onwem n'iru gi ta n'ebubo nile ndi-Ju nēbom:

3. nke ka ebe i mazuru ọme-n'ala nile na ajuju nile di n'etiti ndi-Ju: n'ihi ya ariọm i ka i were ogologo-ntachi-obi nurum.

4. Ya mere, ndi-Ju nile matara ibi-obim site na nwata, nke sitere na mbu di n'etiti mba nke akam, na nime Jerusalem;

5. ebe ha buru uzọ maram site na mbu, ọ buru na ha chọrọ ib͕a àmà, na adim ndu ka onye-Farisi dika irọ-òtù ahu si di nke nēdebezu iwu kari n'uzọ ikpere Chineke ayi.

6. Eguzo-kwa-ram n'ebe a ub͕u a, ebe anēkpem ikpé bayere olile-anya nkwa ahu nke Chineke kwere nna-ayi-hà;

7. bú nkwa nke ebo-ayi iri na abua nēle anya na ha gēru, site n'ikpere Chineke si-ike abali na ehihie. Ọ bu kwa olile-anya nka ka ndi-Ju nēbom ebubo bayere ya, eze!

8. Gini mere anātule ya n'ihe anāgaghi-ekwe n'etiti unu, ma ọ buru na Chineke nēme ka ndi nwuru anwu si n'onwu bilie?

9. N'ezie mu onwem chère n'obim, na aghaghm ime ọtutu ihe megide aha Jisus onye Nazaret.

10. Nke m'me-kwa-ra na Jerusalem: mu onwem mechibido-kwa-ra ọtutu ndi nsọ n'ulo-nkpọrọ, ebe m'natara ike site n'aka ndi-isi-nchu-àjà, mb͕e eb͕uru ha m'we kweye imegide ha.

11. Esite-kwa-ram n'ime ka ha hu ahuhu-nmehie ọtutu mb͕e n'ulo-nzukọ nile chọ uzọ ime ka ha kwulu Chineke; ebe anya nādighm nma gabiga ókè megide ha, m'we nēsob͕u ha we rue obodo di iche eche di n'azu ala-ayi.

12. N'ime ihe ndia mb͕e m'nāga Damaskọs, ebe m'natara ike na nkweye n'aka ndi-isi-nchu-àjà,

13. n'etiti ehihie, eze, ahurum n'uzọ ìhè sitere n'elu-igwe, kariri onwunwu anyanwu, ka ọ nēnwu mu na ndi sorom n'ije buruburu.

14. Mb͕e ayi nile dasiri n'ala, m'we nu otù olu ka ọ nāsim n'asusu Hibru, Sọl; Sọl, gini mere i nēsob͕um? ọ di ike ka i b͕a ndudu eji achu ehi ukwu.

Ọlu Ndi-Ozi 26