1. Agripa we si Pọl, Ekwere ka i kwuere onwe-gi okwu. Mb͕e ahu Pọl setiri aka-ya, we gọpu onwe-ya, si:
2. Eze Agripa, agurum onwem n'onye ngọzi diri, na agajem igọpu onwem n'iru gi ta n'ebubo nile ndi-Ju nēbom:
3. nke ka ebe i mazuru ọme-n'ala nile na ajuju nile di n'etiti ndi-Ju: n'ihi ya ariọm i ka i were ogologo-ntachi-obi nurum.
4. Ya mere, ndi-Ju nile matara ibi-obim site na nwata, nke sitere na mbu di n'etiti mba nke akam, na nime Jerusalem;
5. ebe ha buru uzọ maram site na mbu, ọ buru na ha chọrọ ib͕a àmà, na adim ndu ka onye-Farisi dika irọ-òtù ahu si di nke nēdebezu iwu kari n'uzọ ikpere Chineke ayi.
6. Eguzo-kwa-ram n'ebe a ub͕u a, ebe anēkpem ikpé bayere olile-anya nkwa ahu nke Chineke kwere nna-ayi-hà;
7. bú nkwa nke ebo-ayi iri na abua nēle anya na ha gēru, site n'ikpere Chineke si-ike abali na ehihie. Ọ bu kwa olile-anya nka ka ndi-Ju nēbom ebubo bayere ya, eze!
8. Gini mere anātule ya n'ihe anāgaghi-ekwe n'etiti unu, ma ọ buru na Chineke nēme ka ndi nwuru anwu si n'onwu bilie?
9. N'ezie mu onwem chère n'obim, na aghaghm ime ọtutu ihe megide aha Jisus onye Nazaret.
10. Nke m'me-kwa-ra na Jerusalem: mu onwem mechibido-kwa-ra ọtutu ndi nsọ n'ulo-nkpọrọ, ebe m'natara ike site n'aka ndi-isi-nchu-àjà, mb͕e eb͕uru ha m'we kweye imegide ha.