7. Mb͕e o kwusiri okwu a, esem-okwu we puta n'etiti ndi-Farisi na ndi-Sadusi: ọra ndi ahu we kewa.
8. N'ihi na ndi-Sadusi nāsi na nbilite-n'ọnwu, ma-ọbu mọ-ozi, ma-ọbu mọ, adigh: ma ndi-Farisi nēkwuputa ha abua.
9. Oké iti-nkpu we puta: ufọdu n'etiti ndi-ode-akwukwọ ndi di n'akuku ndi-Farisi we guzo ọtọ, lu kwa ọ̀gù, si, Ayi ahughi ihe ọjọ n'aru nwoke a: ma gini kwa ma ọ buru na mọ ma-ọbu mọ-ozi gwara ya okwu?
10. Mb͕e oké esem-okwu putara, onye-isi-ọchi-agha, ebe ọ nātu egwu na ha gādọkasi Pọl ma eleghi anya, o we gwa ndi-agha ka ha rida napu ya n'ike n'etiti ha, kuta ya n'ulo ndi-agha.
11. Ma n'abali soni Onye-nwe-ayi guzoro n'akuku ya, si, Nwe obi-ike: n'ihi na dika i kwuru okwu bayerem si-ike na Jerusalem, i ghaghi ib͕a kwa àmà otú a na Rom.
12. Mb͕e chi-ya bọrọ, ndi-Ju ufọdu we kekọta onwe-ha n'otù, me kwa onwe-ha ka ha buru anathema, si na ha agaghi-eri ihe ma-ọbu iṅu ihe rue mb͕e ha gēb͕uwori Pọl.
13. Ndi ṅukọrọ iyi a kariri ọgu ndikom abua.
14. Ndi ahu we biakute ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye, si, Ayi ji anathema me onwe-ayi ka ayi buru anathema, na ayi agaghi-edetu ihe ọ bula ọnu rue mb͕e ayi gēb͕uwori Pọl.
15. Ya mere ub͕u a unu onwe-unu na nnọkọ-ikpé-ayi gosi onye-isi-ọchi-agha ka o kuda ya biakute unu, dika unu gaje itule ihe bayere ya nke-ọma kari: ma ayi onwe-ayi bu ndi edoziworo ib͕u ya mb͕e ọ kābiarughi unu nso.
16. Ma nwa nke nwa-nne-nwanyi Pọl nuru na ha nēche inwude ya, o we bia ba n'ulo ndi-agha ahu, kọrọ Pọl.