1. Ma mb͕e o ruru na ayi dọpusiri onwe-ayi n'ebe ha nọ, nupu kwa ub͕ọ, ayi gara otù iru je Kos, ubọchi so ya ayi we rue Rodes, we si n'ebe ahu je rue Patara:
2. ebe ayi huru ub͕o nke nāgabiga ofè Finisia, ayi we ba nime ya, we nupu.
3. Mb͕e ayi hugasiri Saiprọs anya, rapu kwa ya n'aka-ekpe, ayi we ga Siria, we pua n'ub͕ọ na Taia: n'ihi na ebe ahu ka ub͕ọ gaje ikwapu ihe di ya.
4. Mb͕e ayi chọtasiri ndi nēso uzọ Jisus, ayi we nọgide n'ebe ahu ubọchi asa: ndi ahu we gwa Pọl site na Mọ Nsọ, ka ọ ghara izọbà ukwu na Jerusalem.
5. Ma mb͕e o ruru na ayi nọzuru ubọchi ahu, ayi pua ga ije; ha nile, ha na nwunye-ha, na umu-ha, we dupu ayi n'ije-ayi, rue azu obodo-ha: ayi we b͕ue ikperè n'ala n'ótú, kpere Chineke,
6. we kelerita ibe-ayi ekele ikpe-azu; ayi we ba n'ub͕ọ, ma ndi ahu laghachiri n'ulo-ha.
7. Mb͕e ayi onwe-ayi jedebesiri ije-ayi n'ub͕ọ site na Taia, ayi we rue Tọlemais; ayi we kele umu-nna nime Kraist, ayi na ha we nọgide otù ubọchi.
8. Echi-ya ayi we pua, je rue Sisaria: ayi we ba n'ulo Filip onye nēzisa ozi ọma, nke bu otù nime ndikom asa ahu, ayi na ya we nọgide.
9. Ma onye a nwere umu-nwanyi anọ, ndi nāmaghi nwoke, ndi nēbu amuma.
10. Mb͕e ayi nānọgide n'ebe ahu ọtutu ubọchi, otù onye-amuma, aha-ya bu Agabọs, we si na Judia ridata.
11. O we biakute ayi, chiri ihe-ọkiké Pọl, ke onwe-ya ukwú na aka, si, Okwu ndia ka Mọ Nsọ kwuru, si, Otú a ka ndi-Ju ndi nọ na Jerusalem gēke nwoke nwe ihe-ọkiké a, ha gārara kwa ya nye n'aka ndi mba ọzọ.
12. Mb͕e ayi nuru ihe ndia, ayi we riọ ya, ma ayi onwe-ayi ma ndi ebe ahu, ka ọ ghara irigoro Jerusalem.
13. Mb͕e ahu Pọl zara, si, Gini ka unu nēme, ebe unu nākwa ákwá nētiwa kwa obim? n'ihi na edoziwo mu onwem ọ bughi nání ka ewe kem ab͕u, kama inwu kwa ọnwu na Jerusalem n'ihi aha Onye-nwe-ayi Jisus.
14. Mb͕e ọ juru ikweye, ayi we kpuchie ọnu, si, Ka eme ihe Onye-nwe-ayi nāchọ.
15. Mb͕e ubọchi ndia gasiri, ayi we kwakọ ihe-ayi, rigoro Jerusalem.
16. Ufọdu nime ndi nēso uzọ Jisus si na Sisaria so kwa ayi je, nēkuru otù Neson onye Saiprọs, onye sitere na mbu nēso uzọ Jisus, onye ayi gānọ n'ulo-ya dika ndi-ọbìa.
17. Mb͕e ayi ruru Jerusalem, umu-nna-ayi nime Kraist we were ọṅù nara ayi nke-ọma.