4. Sopata, nwa Pirọs, onye Beria, we so ya; ya na Aristakọs na Sekundọs, nime ndi Tesalọnaika; na Gaiọs nke Dabe, na Timọti, na Tikikọs na Trọfimọs, bú ndi Esia.
5. Ma ndia bururi uzọ je, we nēche ayi na Troas.
6. Ayi onwe-ayi we si na Filipai ba n'ub͕ọ je, mb͕e ubọchi achicha ekoghi-eko gasiri, ayi we biakute ha na Troas ka o ruru ubọchi ise; ebe ayi nọgidere ubọchi asa.
7. N'ubọchi mbu n'ízù ubọchi asa, mb͕e ayi zukọrọ inyawa achicha, Pọl we gwa ha okwu, ebe ọ gaje ila echi-ya; o we kwugide okwu rue etiti abali.
8. Ọtutu ọku-ọwa di kwa n'ime-ulo nke di n'elu ulo, ebe ayi zukọrọ.