Ọlu Ndi-Ozi 20:11-19 Bible Nso (IGBOB)

11. Mb͕e ọ rigosiri, nyawa achicha, ri kwa, mb͕e ya na ha kparitasi-kwa-ra ogologo oge, ọbuná rue chi-ọbubọ, o we pua otú a.

12. Ha we kuta nwa-okoro ahu na ndu, ọ bughi kwa nkasi-obi ntà akasiri ha.

13. Ma ayi onwe-ayi, ebe ayi buru uzọ je ub͕ọ, ayi nupuru ub͕ọ ahu ije Asọs, n'ihi na ayi zubere iwere Pọl n'ub͕ọ n'ebe ahu: n'ihi na otú a ka ọ karari, ebe o zubere na ya onwe-ya gāga n'ukwu-ala.

14. Mb͕e o zutere ayi n'Asọs, ayi were ya n'ub͕ọ, we bia rue Mitilini.

15. Ayi we si n'ebe ahu ga, we rue na ncherita-iru Kaiọs n'ubọchi soni; ubọchi so ya ayi we rue ala na Samọs, we chere oge ufọdu na Trogilium; ubọchi soni ayi we bia rue Militọs.

16. N'ihi na Pọl zubereri igabiga Efesọs n'ub͕ọ, ka aghara ime ya ka ọ nọgide ogologo oge n'Esia; n'ihi na ọ nēme ngwa iru Jerusalem mb͕e ubọchi Pentikọst akērughi, ma ọ buru na ọ puru ime ya.

17. O we si na Militọs ziga n'Efesọs, kpọ ndi-okenye nke nzukọ Kraist ka ha biakute ya.

18. Mb͕e ha biakutere ya, ọ si ha,Unu onwe-unu mara, site n'ubọchi mbu m'zọrọ ukwu n'Esia, otú m'nọ n'etiti unu oge ahu nile,

19. otú m'buru orù Onye-nwe-ayi n'obi di ume-ala nile, na anya-miri, na ọnwunwa di iche iche nke dakwasirim n'ajọ ìzù nile nke ndi-Ju:

Ọlu Ndi-Ozi 20