Ọlu Ndi-Ozi 15:19-28 Bible Nso (IGBOB)

19. N'ihi nka uche nke mu onwem bu, ka ayi ghara isob͕u ndi si n'etiti ndi mba ọzọ chigharikute Chineke:

20. kama ka ayi zigara ha akwukwọ-ozi, ka ha rapu ihe ruru árú nke arusi nile, na ikwa-iko, na anu anyab͕uru anyab͕u, na ọbara.

21. N'ihi na Moses site n'ọb͕ọ mbu nile nwere n'obodo dum ndi nēkwusa ya, ebe anāgu ya n'ulo-nzukọ nile ubọchi-izu-ike dum.

22. Mb͕e ahu ọ di ndi-ozi na ndi-okenye nma, ha na nzukọ Kraist dum, irọputa ndikom ufọdu nime ha, na iziga ha n'Antiọk, ha na Pọl na Banabas; bú Judas anākpọ Basabas, na Sailas, ndikom bu ndi-isi n'etiti umu-nna nime Kraist:

23. ha site-kwa-ra n'aka-ha de akwukwọ, si, Ndi-ozi na umu-nna-unu, bú ndi-okenye, nēdegara umu-nna-ayi akwukwọ, bú ndi sitere na ndi mba ọzọ, ndi bi n'Antiọk na Siria na Silisia, ayi nēkele unu:

24. Ebe ayi nuru na ufọdu ndi siri n'etiti ayi pua were okwu me ka obi lọ unu miri, nēmebi nkpuru-obi-unu; bú ndi ayi nēnyeghi ihe ọ bula n'iwu;

25. ọ di ayi nma, ebe ayi biaworo nwe otù obi, irọputa ndikom na iwere ha zigara unu, ha na Banabas na Pọl, ndi ayi huru n'anya,

26. ndi raraworo ndu-ha nye n'ihi aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.

27. Ya mere ayi ezitewo Judas na Sailas, ndi ha onwe-ha gākọ-kwa-ra unu otù ihe ndia n'okwu ọnu.

28. N'ihi na ọ di Mọ Nsọ nma, di kwa ayi onwe-ayi nma, ka ayi ghara ibo unu ibu arọ́ kari ihe ndia di nkpà:

Ọlu Ndi-Ozi 15