36. Okwu nke O zitere umu Israel, nēzisa ozi ọma nke udo site n'ọnu Jisus Kraist (Onye ahu bu Onye-nwe madu nile)
37. akukọ ahu unu onwe-unu matara, nke putara ìhè na Judia dum, nāmalite site na Galili, mb͕e baptism nke Jọn kwusara gasiri;
38. bú Jisus Nke si na Nazaret puta, otú Chineke were Mọ Nsọ na ike te Ya dika manu-otite: Onye jeghariri nālu ọlu ọma, nēme kwa ka aru di ha ike, bú ndi nile ekwensu mere ha dika onye-nwe-ha; n'ihi na Chineke soro Ya.
39. Ayi onwe-ayi bu kwa ndi-àmà nke ihe nile O mere n'ala ndi-Ju, na nime Jerusalem; Onye ha b͕u-kwa-ra, nākwuba Ya n'elu osisi.
40. Onye ahu ka Chineke mere ka O si n'ọnwu bilie n'ubọchi nke-atọ, O were kwa Ya nye ka egosi Ya n'ìhè.