31. si, Kọniliọs, anuru ekpere-gi, echeta-kwa-ra ọlu ebere gi nile n'iru Chineke.
32. Ya mere ziga na Jọpa, kpọtara onwe-gi Saimon, onye anākpọ kwa Pita; onye ahu nānọ dika ọbìa n'ulo Saimon, bú onye nēdozi akpukpọ anu n'usọ oké osimiri.
33. Ya mere n'otù oge ahu ka m'zigara gi; gi onwe-gi me-kwa-ra nke-ọma na i biawo. Ya mere ub͕u a ayi onwe-ayi nile nọ n'ebe a n'iru Chineke, inu ihe nile nke Onye-nwe-ayi nyeworo gi n'iwu.
34. Pita we saghe ọnu-ya, si,N'ezie anamaghọta na Chineke abughi onye nēle madu anya n'iru: