Ndi Rom 16:18-27 Bible Nso (IGBOB)

18. N'ihi na ndi di otú a abughi orù nke Onye-nwe-ayi Kraist, kama orù nke afọ nke ha; ha were kwa okwu utọ ha na okwu ọma ha nāghọb͕u obi ndi nāmaghi ihe ọjọ.

19. N'ihi na iṅa-nti-unu eruzuwo na nti madu nile. Ya mere anamaṅuri ọṅu n'isi unu: ma anamachọ ka unu buru ndi-amam-ihe n'ebe ezi ihe di, ma ndi arughi-árú n'ebe ihe ọjọ di.

20. Ma Chineke nke udo gāzọpia Setan n'okpuru ukwu-unu ọsọsọ.Amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist diyere unu.

21. Timọti onye mu na ya nālukọ ọlu nēkele unu; na Lusiọs na Jeson na Sosipata, ndi-ikwum.

22. Mu onwem, bú Tatiọs, onye nēde akwukwọ-ozi a, nēkele unu nime Onye-nwe-ayi.

23. Gaiọs, onye nēlem na nzukọ Kraist dum ọbìa, nēkele unu. Erastọs onye nāchi ihe obodo nēkele unu, na Kwọtọs nwa-nna-ayi.

24. Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist diyere unu nile. Amen.

25. Ma Onye ahu Nke puru ime ka unu guzosie ike dika ozi ọmam na nkwusa nke Jisus Kraist si di, dika nkpughe nke ihe-omimi ahu si di nke emeworo ka o kpuchie ọnu n'oge ebighi-ebi,

26. ma ub͕u a ka emere ka ọ puta ìhè, esite kwa n'ihe ndi-amuma deworo n'akwukwọ me ka mba nile mara ya, dika ihe Chineke ebighi-ebi nyere n'iwu si di, rue iṅa-nti nke okwukwe;

27. Chineke Nke nání Ya bu Onye-amam-ihe, site n'aka Jisus Kraist, Onye otuto diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.

Ndi Rom 16