13. Kelenu Rufọs onye arọputara nime Onye-nwe-ayi, na nne-ya nke bu kwa nnem.
14. Kelenu Asinkritọs, Flegon, Hamis, Patrọbas, Hamas, na umu-nna ndi ha na ha nọ.
15. Kelenu Filọlọgọs na Julia, Nireọs na nwa-nne-ya nwayi, na Ọlimpas, na ndi nsọ nile ndi ha na ha nọ.
16. Werenu isutu-ọnu di nsọ kelerita onwe-unu. Nzukọ Kraist nile nēkele unu.
17. Ma anamariọ unu, umu-nnam, ka unu le ha anya, bú ndi nēweta nkewa di iche iche ahu na ọnyà di iche iche ahu, nēmegide ozizí nke unu onwe-unu mutara: ka unu nēze kwa ha.
18. N'ihi na ndi di otú a abughi orù nke Onye-nwe-ayi Kraist, kama orù nke afọ nke ha; ha were kwa okwu utọ ha na okwu ọma ha nāghọb͕u obi ndi nāmaghi ihe ọjọ.
19. N'ihi na iṅa-nti-unu eruzuwo na nti madu nile. Ya mere anamaṅuri ọṅu n'isi unu: ma anamachọ ka unu buru ndi-amam-ihe n'ebe ezi ihe di, ma ndi arughi-árú n'ebe ihe ọjọ di.
20. Ma Chineke nke udo gāzọpia Setan n'okpuru ukwu-unu ọsọsọ.Amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist diyere unu.
21. Timọti onye mu na ya nālukọ ọlu nēkele unu; na Lusiọs na Jeson na Sosipata, ndi-ikwum.
22. Mu onwem, bú Tatiọs, onye nēde akwukwọ-ozi a, nēkele unu nime Onye-nwe-ayi.
23. Gaiọs, onye nēlem na nzukọ Kraist dum ọbìa, nēkele unu. Erastọs onye nāchi ihe obodo nēkele unu, na Kwọtọs nwa-nna-ayi.
24. Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist diyere unu nile. Amen.