Ndi Rom 11:9-15 Bible Nso (IGBOB)

9. Devid nāsi kwa,Ka table-ha ghọ ib͕udu, na ihe eji achu ha ntà,Na ọnyà, na ihe-nnyeghachi n'ebe ha nọ:

10. Ka anya-ha b͕a ọchichiri, ka ha we ghara ihu uzọ,Gi me kwa ka azú-ha ruru mb͕e nile.

11. Ya mere m'nāsi, Ọ̀ gābu na ha suru ngọngọ ka ha we da? Chineke ekwela: kama nzọputa sitere na ndahie-ha ru ndi mba ọzọ aka, ka ewe kpasue ha ekworo.

12. Ma ọ buru na ndahie-ha bu àkù nke uwa, ọ buru kwa na ila-ala-ha bu àkù nke ndi mba ọzọ; òzùzù-ha gēsi aṅa ghara ibu kari àkù-ha nke-uku?

13. Ma ọ bu unu ndi mba ọzọ ka m'nāgwa okwu, (n'ezie, ka ọ ra, bú onye-ozi nke ndi mba ọzọ mu onwem bu, anamenye ije-ozim otuto):

14. ma ọ buru na agamakpasu ndi-arum ekworo n'uzọ ọ bula, we zọputa ufọdu n'etiti ha.

15. N'ihi na asi na nchupu-ha bu ime ka uwa na Chineke di n'otù, gini ka nkpọbata-ha gābu, ma-ọbughi ndu sitere na ndi nwuru anwu?

Ndi Rom 11