Ndi Rom 11:2-14 Bible Nso (IGBOB)

2. Chineke enupughi ndi-Ya nke O buru uzọ mara. Ma-ọbu ùnu amataghi ihe ọ nēkwu, bú ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, n'ebe edeworo okwu bayere Elaija? otú ọ nāriọ Chineke aririọ megide Israel, si,

3. Onye-nwe-ayi, ha b͕uru ndi-amuma-Gi, ha gwudara ebe-ichu-àjà-Gi nile: nání mu onwem fọdu-kwa-ra, ha nāchọ kwa ndum.

4. Ma gini ka ndum-ọdu Chineke nāgwa Ya? Arapurum nye Onwem nnù ndikom iri-na-asa na ọgu iri, madu ndi ọ dighi mb͕e ha b͕uru ikperè nye Beal.

5. Ya mere otú a n'oge di ub͕u a ndi fọduru aputawo kwa dika nrọputa nke amara si di.

6. Ma ọ buru na ọ di n'amara, o siteghi kwa ọzọ n'ọlu: ebe ahuru na amara abughi amara ọzọ, ma asi na ọ dighi otú a.

7. Gini kwa? Ihe Israel nāchọ, nke ahu ka ọ nāhughi; ma nrọputa ahu huru ya, ma emere ka obi ndi fọduru me etili:

8. dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Chineke nyere ha mọ nke oké ura, anya ighara ihu uzọ, na nti ighara inu ihe, rue ubọchi ta.

9. Devid nāsi kwa,Ka table-ha ghọ ib͕udu, na ihe eji achu ha ntà,Na ọnyà, na ihe-nnyeghachi n'ebe ha nọ:

10. Ka anya-ha b͕a ọchichiri, ka ha we ghara ihu uzọ,Gi me kwa ka azú-ha ruru mb͕e nile.

11. Ya mere m'nāsi, Ọ̀ gābu na ha suru ngọngọ ka ha we da? Chineke ekwela: kama nzọputa sitere na ndahie-ha ru ndi mba ọzọ aka, ka ewe kpasue ha ekworo.

12. Ma ọ buru na ndahie-ha bu àkù nke uwa, ọ buru kwa na ila-ala-ha bu àkù nke ndi mba ọzọ; òzùzù-ha gēsi aṅa ghara ibu kari àkù-ha nke-uku?

13. Ma ọ bu unu ndi mba ọzọ ka m'nāgwa okwu, (n'ezie, ka ọ ra, bú onye-ozi nke ndi mba ọzọ mu onwem bu, anamenye ije-ozim otuto):

14. ma ọ buru na agamakpasu ndi-arum ekworo n'uzọ ọ bula, we zọputa ufọdu n'etiti ha.

Ndi Rom 11