Ndi-Ikpe 8:9-14 Bible Nso (IGBOB)

9. O we gwa kwa ndikom Penuel okwu, si, Mb͕e m'latara n'udo, m'gākwatu ulo-elu a.

10. Ma Zeba na Zalmuna nọ nime Kakoa, ha na ọmuma-ulo-ikwū nile ha, ihe ra ka orú nnù ndikom, na nnù iri-na-asa, na ọgu iri, ndi fọduru site n'ọmuma-ulo-ikwū nile nke umu Iru-anyanwu: ma ndi daworo di orú nnù ndikom uzọ iri-na-ise, ndi nāmiputa mma-agha.

11. Gideon we rigo n'uzọ ndi bi n'ulo-ikwū n'Iru-anyanwu Noba na Jọgbeha, o tib͕ue ọmuma-ulo-ikwū ahu; n'ihi na ọmuma-ulo-ikwū ahu nọ na ntukwasi-obi na ihe agaghi-eme ha.

12. Ma Zeba na Zalmuna b͕alagara; o we chua ha; o we nwude ndi-eze abua nke Midian, bú Zeba na Zalmuna, me ka ọmuma-ulo-ikwū ahu nile ma jijiji.

13. Gideon nwa Joash we si n'agha ahu site na nrigo Heres lata.

14. Ọ nwude otù nwa-okorọbia sitere na ndikom Sukot, o we jua ya ajuju: o we dere ya aha ndi-isi Sukot na ndi-okenye-ya n'akwukwọ, ọgu ndikom atọ na iri na asa.

Ndi-Ikpe 8