1. Jerubeal (onye ahu bu Gideon), na ndi nile soro ya, we bilie n'isi-ututu, ma ulo-ikwū-ha n'akuku isi-iyi Harod: ọmuma-ulo-ikwū Midian we di n'akuku Ugwu ha, site n'ugwu ntà More, nime ndagwurugwu.
2. Jehova we si Gideon, Ndi nke nēso gi baram uba inye Midian n'aka-ha, ka Israel we ghara inya isi megidem, si, Akam azọputawom.