Ndi-Ikpe 3:4-14 Bible Nso (IGBOB)

4. Ha di kwa ka ewere ha nwa Israel, imara ma ha gānu ihe nile Jehova nyere n'iwu, nke O nyere ndi bu nna-ha n'iwu n'aka Moses.

5. Umu Israel we biri n'etiti ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus:

6. ha we lutara onwe-ha umu-ha ndinyom na nwunye, were umu-ha ndinyom nye umu-ha ndikom, fè kwa chi nile ha òfùfè.

7. Umu Israel we me ihe ọjọ n'anya Jehova, chezọ Jehova, bú Chineke-ha, fè Bealim na Asherot.

8. Iwe Jehova we di ọku megide Israel, O we renye ha n'aka Kushan-rishataim, bú eze Mesọpọtemia; umu Israel we fè Kushan-rishataim òfùfè arọ asatọ.

9. Umu Israel we tikue Jehova, Jehova we me ka onye-nzọputa biliere umu Israel, ọ we zọputa ha, bú Ọtniel nwa Kenaz, nwa-nne ntà Keleb.

10. Mọ nke Jehova we dikwasi ya, o we kpe Israel ikpe; ọ pua ibu agha, Jehova we nye Kushan-rishataim, bú eze Mesọpọtemia, n'aka-ya: aka-ya we di ike n'aru Kushan-rishataim.

11. Ala ahu we di jū ọgu arọ abua. Ọtniel nwa Kenaz we nwua.

12. Umu Israel we me kwa ihe ọjọ n'anya Jehova ọzọ: Jehova we me ka Eglon, bú eze Moab, di ike imegide Israel, n'ihi na ha emewo ihe ọjọ n'anya Jehova.

13. O we chikọtara onwe-ya umu Amon na Amalek, je tib͕ue Israel, ha we nweta obodo nkwu ahu.

14. Umu Israel we fè Eglon, bú eze Moab, òfùfè arọ iri na asatọ.

Ndi-Ikpe 3