Ndi-Ikpe 21:2-16 Bible Nso (IGBOB)

2. Ndi Israel we biarue Bet-el, nọdu n'ebe ahu rue anyasi n'iru Chineke, welie olu-ha, kwa ákwá nke-uku.

3. Ha we si, Jehova, bú Chineke nke Israel, n'ìhi gini ka nka di n'Israel, na agāgupu otù ebo n'Israel ta?

4. O rue, n'echi-ya, na ndi Israel biliri n'isi-ututu, wue ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, sure àjà-nsure-ọku na àjà-udo.

5. Umu Israel we si, Ònye nọ n'etiti ebo nile nke Israel nke nārigokuteghi Jehova nime nkpọkọta? N'ihi na ọṅuǹu-iyi uku di bayere onye ahu nke nārigokuteghi Jehova rue Mizpa, si, Aghaghi ime ka ọ nwua.

6. Umu Israel we cheghari uche bayere Benjamin, bú nwa-nne-ha, si, Ebipuru otù ebo n'Israel ta.

7. Gini ka ayi gēmere ha, bú ndi fọduru, inye ha nwunye, ebe ayi onwe-ayi were Jehova ṅua iyi na ayi agaghi-enye ha nime umu-ayi ndinyom na nwunye?

8. Ha we si, Ònye bu onye ahu n'etiti ebo Israel nile nke nārigokuteghi Jehova rue Mizpa? Ma, le, ọ dighi nwoke si na Jebesh-gilead bata n'ọmuma-ulo-ikwū rue nkpọkọta ahu.

9. Ndi Israel we gukọta onwe-ha, ma, le, ọ dighi nwoke sitere na ndi bi na Jebesh-gilead nọ n'ebe ahu.

10. Nzukọ Israel we ziga n'ebe ahu orú nnù ndikom na nnù iri sitere na ndi bu dìnkpà, ha we nye ha iwu, si, Jenu, were ọnu mma-agha tib͕ue ndi bi na Jebesh-gillead, ha na ndinyom na umu-ntakiri.

11. Nka bu kwa ihe unu gēme; unu gēwezuga nwoke ọ bula na nwayi ọ bula nke mara ndina nwoke, ka ebibie ya.

12. Ha we chọta n'etiti ndi bi na Jebesh-gilead nnù umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke site na ndina nwoke: ha we me ka ha biarue ọmuma-ulo-ikwū rue Shailo nke di n'ala Kenean.

13. Nzukọ Israel nile we ziga, gwa umu Benjamin okwu, bú ndi nọ na nkume di elu, bú Rimon, we kpọ ha òkù udo.

14. Benjamin we lata na mb͕e ahu; ha we nye ha ndinyom ahu ndi ha mere ka ha di ndu site na ndinyom Jebesh-gilead: ma ha achọtaghi nwunye gēzuru ha nile otú a.

15. Ndi Israel we cheghari uche bayere Benjamin, n'ihi na Jehova emewo ntiwa n'ebo Israel nile.

16. Ndi-okenye nzukọ Israel we si, Gini ka ayi gēmere ndi fọduru inye ha nwunye, n'ihi na ekpochapuwo ndinyom nime Benjamin?

Ndi-Ikpe 21