Ndi-Ikpe 21:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma ndikom Israel ṅuru iyi na Mizpa, si, Ọ dighi nwoke ọ bula nime ayi gēnye Benjamin nwa-ya nwayi na nwunye.

2. Ndi Israel we biarue Bet-el, nọdu n'ebe ahu rue anyasi n'iru Chineke, welie olu-ha, kwa ákwá nke-uku.

3. Ha we si, Jehova, bú Chineke nke Israel, n'ìhi gini ka nka di n'Israel, na agāgupu otù ebo n'Israel ta?

4. O rue, n'echi-ya, na ndi Israel biliri n'isi-ututu, wue ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, sure àjà-nsure-ọku na àjà-udo.

5. Umu Israel we si, Ònye nọ n'etiti ebo nile nke Israel nke nārigokuteghi Jehova nime nkpọkọta? N'ihi na ọṅuǹu-iyi uku di bayere onye ahu nke nārigokuteghi Jehova rue Mizpa, si, Aghaghi ime ka ọ nwua.

6. Umu Israel we cheghari uche bayere Benjamin, bú nwa-nne-ha, si, Ebipuru otù ebo n'Israel ta.

7. Gini ka ayi gēmere ha, bú ndi fọduru, inye ha nwunye, ebe ayi onwe-ayi were Jehova ṅua iyi na ayi agaghi-enye ha nime umu-ayi ndinyom na nwunye?

8. Ha we si, Ònye bu onye ahu n'etiti ebo Israel nile nke nārigokuteghi Jehova rue Mizpa? Ma, le, ọ dighi nwoke si na Jebesh-gilead bata n'ọmuma-ulo-ikwū rue nkpọkọta ahu.

9. Ndi Israel we gukọta onwe-ha, ma, le, ọ dighi nwoke sitere na ndi bi na Jebesh-gilead nọ n'ebe ahu.

Ndi-Ikpe 21