25. O rue, mb͕e obi-ha di nma, na ha siri, Kpọnu Samson, ka ọ we mere ayi ihe-ọchì. Ha we si n'ulo ndi ekere ab͕u kpọputa Samson; o we me ihe-ọchì n'iru ha: ha we me ka o guzo n'etiti ogidi.
26. Samson we si nwa-okoro onye nēji ya n'aka, Ka m'nọduru onwem, ka m'we metu ogidi nke ulo nēguzosi ike n'elu ha aka, ka m'we dabere ha.
27. Ma ulo ahu juputara na ndikom na ndinyom; n'ebe ahu ka ndi-isi nile nke ndi Filistia nọ kwa; ihe ra ka nnù ndikom na ndinyom asa na ọgu iri nọ kwa n'elu ulo, ndi nēle ka Samson nēme ihe-ọchì.