13. Mọ-ozi nke Jehova we si Manoa, N'ihe nile nke m'siri nwayi a ya lezie anya.
14. Ọ gaghi-eri ihe sitere n'ihe ọ bula nke nēsi n'osisi vine nke manya-vine puta, ya aṅu-kwa-la manya-vine na ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, ya eri-kwa-la ihe ọ bula ruru árú; ihe nile nke m'nyere ya n'iwu ka ọ gēdebe.
15. Manoa we si mọ-ozi nke Jehova, Biko, kwe ka ayi b͕ochie gi, ka ayi we dozie nwa-ewu n'iru gi.
16. Mọ-ozi nke Jehova we si Manoa, Ọ buru na i b͕ochiem, m'gaghi-eri nime nri-gi: ọ buru kwa na i me àjà-nsure-ọku, ọ bu Jehova ka i gēsurere ya. N'ihi na Manoa amaghi na mọ-ozi nke Jehova ka ọ bu.
17. Manoa we si mọ-ozi nke Jehova, Gini bu aha-gi, ka ayi we sọpuru gi mb͕e okwu-gi nile gēre?
18. Mọ-ozi nke Jehova we si ya, N'ìhi gini kwa ka i nāju ajuju bayere aham, ebe aha ahu di ebube?
19. Manoa we were nwa-ewu ahu na onyinye-inata-iru-ọma, surere ya Jehova ọku n'elu oké nkume: mọ-ozi nālu kwa oké ọlu, ma Manoa na nwunye-ya nēle ya anya.
20. O rue, mb͕e ire-ọku nēsi n'ebe-ichu-àjà ahu rigo n'elu-igwe, na mọ-ozi nke Jehova rigoro nime ire-ọku nke ebe-ichu-àjà ahu: Manoa na nwunye-ya nēle kwa ya anya; ha we da kpue iru-ha n'ala.
21. Ma mọ-ozi ahu emeghi ka Manoa na nwunye-ya hu kwa ya anya ọzọ. Mb͕e ahu Manoa mara na mọ-ozi nke Jehova ka ọ bu.
22. Manoa we si nwunye-ya, Ayi aghaghi inwu, n'ihi na ọ bu Chineke ka ayi huworo.
23. Nwunye-ya we si ya, Ọ buru na ọ tọrọ Jehova uto ime ka ayi nwua, Ọ gaghi-anarawori àjà-nsure-ọku na onyinye-inata-iru-ọma n'aka-ayi, Ọ gaghi-eme kwa ka ayi hu ihe ndia nile, Ọ gaghi-eme kwa ayi nu ihe di otú a dika na mb͕e a.
24. Nwanyi ahu we mua nwa-nwoke, kpọ aha-ya Samson: nwata ahu we tó etó, Jehova we gọzie ya.
25. Mọ nke Jehova we malite ikwali obi-ya na Mahane-dan, n'etiti Zọra na Eshtaol.