13. N'ihi na asi na ọbara nke ewu na nke oke-ehi, na ntu nke nwa-ab͕ọghọ-ehi, mb͕e ọ nēfesa ndi emeruworo emeru, nēdo madu nsọ ime ka anu-aru-ha di ọcha:
14. ọ̀bara Kraist, Onye sitere n'aka Mọ ebighi-ebi che Onwe-ya nātaghi uta n'iru Chineke, gēsi aṅa ghara ime akọ-na-uche-ayi ka ọ di kari ọcha nke-uku ri nne pua n'ọlu nile nwuru anwu ikpere Chineke di ndu?
15. Ọ bu kwa n'ihi nka ka Ọ bu onye-ob͕ub͕o nke ọb͕ub͕a-ndu ọhu, ka ọ gābu, ebe otù Onye nwuru ib͕aputa madu n'aka njehie nile nke di n'okpuru ọb͕ub͕a-ndu mbu ahu, ka ndi akpọworo we nata nkwa nke nketa ebighi-ebi ahu.
16. N'ihi na ebe ọb͕ub͕a-ndu di, ọ di nkpà ka ọnwu nke onye b͕ara ya di ya.
17. N'ihi na ọb͕ub͕a-ndu nēguzosi ike n'elu ndi nwuru anwu: n'ihi na ò nwere uzọ ọ gābu ihe di ike mb͕e ọ bula onye b͕ara ya di ndu?
18. Ya mere emeghi ọbuná ọb͕ub͕a-ndu mbu ahu ọhu nējighi ọbara.
19. N'ihi na mb͕e Moses gwarari ndi Israel nile ihe nile ọ bula enyere n'iwu dika iwu ahu si di, ọ nara ọbara nke umu-ehi na ewu nile, ya na miri na aji-anu uhie na hyssop, we fesa akwukwọ ahu onwe-ya, na ndi Israel nile,
20. si, Nka bu ọbara nke ọb͕ub͕a-ndu ahu nke Chineke nyere unu n'iwu.
21. O we were ọbara ahu fesa kwa ulo-ikwū ahu na ihe nile nke ifè-òfùfè-ya otú ahu.
22. Ọ fọduru ihe ntà ka m'si na eji kwa ọbara eme ihe nile ka ha di ọcha, dika iwu-ayi si di, ọ buru kwa na nwusì ọbara adighi nb͕aghara nmehie adighi.
23. Ya mere ọ di nkpà ka ewere ihe ndia me ka ihe-nṅomi nile nke ihe nile di n'elu-igwe di ọcha; ma ọ di nkpà ka ewere àjà ka ndia nma me ihe ahu onwe-ha nke di n'elu-igwe ka ha di ọcha.