1. Ya mere, ọbuná ọb͕ub͕a-ndu mbu nwere ihe di iche iche aguru n'ihe ziri ezi n'ikpere Chineke, nwe kwa ebe nsọ ya, bú ebe nsọ nke uwa nka.
2. N'ihi na edoziri ulo-ikwū, ulo mbu, nke ihe-idọba-oriọna ahu, na table ahu, na ob͕e achicha ahu anēche n'iru Chineke di nime ya; nke anākpọ Ebe Nsọ.
3. Ma mb͕e agabigasiri ákwà-nb͕ochi nke-abua, ulo-ikwū nke anākpọ Ebe Nsọ kachasi ebe nsọ nile di;
4. nke nwere ebe-ichu-àjà ọla-edo isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na ib͕e nke ọb͕ub͕a-ndu ahu nke amachitara ọla-edo gburugburu n'akuku nile, nke ite ọla-edo nke nwere manna di nime ya, ya na nkpa-n'aka ahu nke Eron nke mara ifuru, na mbadamba nkume abua nke ọb͕ub͕a-ndu ahu;
5. ma n'elu ya cherubim nke ebube di nēnye ebe anēme ka obi Chineke juru ǹdò; nke ayi nēnweghi ike ikwu okwu bayere ha n'otù n'otù ub͕u a.
6. Ma ebe edoziworo ihe ndia otú a, ndi-nchu-àjà nābà n'ulo-ikwū mbu mb͕e nile, nēkpezu ekpere nile ha;
7. ma nání onye-isi-nchu-àjà nābà n'ulo-ikwū nke-abua, nání otù mb͕e n'arọ, nāb͕aghi aka ọbara, nke ọ nēche n'iru Chineke n'ihi onwe-ya, na n'ihi amaghi-ama nile nke ndi Israel:
8. n'ihi na Mọ Nsọ nēgosi nka, na akēmeghi ka uzọ ibà n'ebe nsọ ahu puta ìhè, mb͕e ulo-ikwū mbu ahu nēguzogide ub͕u a:
9. bú ulo-ikwū nke bu ulọ aturu oge nke di ub͕u a; anēche kwa ma onyinye ma àjà n'iru Chineke dika ulo-ikwū ahu si di, bú ihe nāpughi ime onye nēkpe ekpere ka o zu okè n'akuku akọ-na-uche,
10. ebe ha bu nání (ha na ihe-oriri na ihe-ọṅuṅu na ime-baptism di iche iche) ihe di iche iche nke anu-aru aguru n'ihe ziri ezi, enyere n'iwu rue oge imezi ihe.
11. Ma Kraist, ebe Ọ biara ka Ọ buru onye-isi-nchu-àjà nke ezi ihe nile gaje ibia, O sitere n'ulo-ikwū ahu nke ka uku na nke zuru okè kari, ọ bughi nke eji aka me, nke isi-ya bu, ọ bughi nke òkìkè a,
12. O siteghi kwa n'ọbara nke ewu na nke umu-ehi, kama O sitere n'ọbara nke Ya onwe-ya, ba n'ebe nsọ nání otù mb͕e, ebe Ọ chọputara nb͕aputa ebighi-ebi.