Matiu 10:24-30 Bible Nso (IGBOB)

24. Onye nēso uzọ onye-ozizí adighi-aka onye-ozizí-ya, orù adighi-aka kwa onye-nwe-ya.

25. O zuworo onye nēso uzọ onye-ozizí ka ọ di ka onye-ozizí-ya, na orù ahu ka ọ di ka onye-nwe-ya. Ọ buru na ha kpọrọ Nna-nwe-ulo Beelzebul, hà gēsi aṅa ghara ikpọ ndi èzí-na-ulo-Ya kari nke-uku?

26. Ya mere, unu atula egwu ha: n'ihi na ọ dighi ihe ọ bula ekpuchiworo ekpuchi, nke anāgaghi-ekpughe; ọ dighi kwa ihe ezoro ezo, nke anāgaghi-ama.

27. Okwu M'nāgwa unu n'ọchichiri, kwuenu ya n'ìhè: ihe unu nānu kwa na nti, kwusanu ya n'elu ulo.

28. Unu atu-kwa-la egwu ndi nēb͕u aru, ma ha apughi ib͕u nkpuru-obi: kama nātunu egwu Onye ahu Nke puru ila nkpuru-obi na aru n'iyì n'ọku ala-mọ.

29. Àdighi-ere egwele abua n'otù penny? ma otù nime ha agaghi-adà n'ala ma Nna-unu ekwegh:

30. ma ọbuná agiri-isi nile nke isi-unu ka aguworo.

Matiu 10