15. N'ezie asim unu, Ala Sọdọm na Gọmọra gānagide okwu n'ubọchi ikpé kari obodo ahu.
16. Le, Mu onwem nēzipu unu dika aturu n'etiti agu: ya mere, burunu ndi nwere uche dika agwọ, ndi nādighi kwa aghughọ dika nduru.
17. Ma nēzenu madu: N'ihi na ha gārara unu nye n'aka nnọkọ-ikpé di iche iche, n'ulo-nzukọ nile ha ka ha gāpia kwa unu ihe;
18. e, n'iru ndi-isi na ndi-eze ka agēkuru kwa unu je n'ihim, iburu ha na ndi mba ọzọ àmà.
19. Ma mb͕e ọ bula ha gārara unu nye, unu echeb͕ula onwe-unu otú unu gēkwu ma-ọbu okwu unu gēkwu: n'ihi na agēnye unu n'oge hour ahu okwu unu gēkwu.
20. N'ihi na ọ bughi unu onwe-unu nēkwu, kama ọ bu Mọ nke Nna-unu Nke nēkwu nime unu.
21. Nwa-nne gārara kwa nwa-nne-ya nye n'ọnwu, nna gārara kwa nwa-ya nye: umu gēbili kwa megide ndi muru ha, me ka ha nwua anwu.
22. Madu nile gākpọ kwa unu asì n'ihi aham: ma onye were ntachi-obi nọgide rue ọgwugwu ihe nile, onye ahu ka agāzọputa.
23. Ma mb͕e ọ bula ha sob͕uru unu n'obodo a, b͕alaga n'obodo di iche: n'ihi na n'ezie asim unu, Unu agaghi-agazù obodo nile nke Israel ma-ọli, rue mb͕e Nwa nke madu gābia.
24. Onye nēso uzọ onye-ozizí adighi-aka onye-ozizí-ya, orù adighi-aka kwa onye-nwe-ya.
25. O zuworo onye nēso uzọ onye-ozizí ka ọ di ka onye-ozizí-ya, na orù ahu ka ọ di ka onye-nwe-ya. Ọ buru na ha kpọrọ Nna-nwe-ulo Beelzebul, hà gēsi aṅa ghara ikpọ ndi èzí-na-ulo-Ya kari nke-uku?
26. Ya mere, unu atula egwu ha: n'ihi na ọ dighi ihe ọ bula ekpuchiworo ekpuchi, nke anāgaghi-ekpughe; ọ dighi kwa ihe ezoro ezo, nke anāgaghi-ama.
27. Okwu M'nāgwa unu n'ọchichiri, kwuenu ya n'ìhè: ihe unu nānu kwa na nti, kwusanu ya n'elu ulo.
28. Unu atu-kwa-la egwu ndi nēb͕u aru, ma ha apughi ib͕u nkpuru-obi: kama nātunu egwu Onye ahu Nke puru ila nkpuru-obi na aru n'iyì n'ọku ala-mọ.
29. Àdighi-ere egwele abua n'otù penny? ma otù nime ha agaghi-adà n'ala ma Nna-unu ekwegh:
30. ma ọbuná agiri-isi nile nke isi-unu ka aguworo.