27. Madu ọ bula nke gēri ọbara ọ bula, agēbipu kwa madu ahu n'etiti umu-nna-ya.
28. Jehova we gwa Moses okwu, si,
29. Gwa umu Israel okwu, si, Onye nēwetara Jehova nso ihe àjà nke àjà-udo-ya gēsi n'ihe àjà nke àjà-udo-ya wetara Jehova onyinye-ya iji biaru nso:
30. aka ya gēweta àjà-ọku nke Jehova; abuba di n'akuku okpukpu-obi ka ọ gēweta, ya na okpukpu-obi, ifé ya ka ọ buru àjà-ofufé n'iru Jehova.
31. Onye-nchu-àjà gēsure kwa abuba ahu ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísi utọ n'ebe-ichu-àjà: ma okpukpu-obi ahu ka Eron na umu-ya ndikom gēnwe.
32. Utaku-ukwu aka-nri ka unu gēnye kwa onye-nchu-àjà ibu àjà-nbuli sitere n'ihe àjà nile nke àjà-udo-unu.