15. O we di ka anētib͕u Joshua na Israel nile n'iru ha, ha we b͕alaga n'uzọ ọzara.
16. Ewe tikue ndi nile nọ n'obodo ahu nkpu ichu ha n'azu: ha we chua Joshua n'azu, ewe dọpu ha n'obodo.
17. Ọ dighi kwa nwoke fọduru na Ai ma-ọbu na Bet-el, nke nāpughi ichu Israel: ha we rapu obodo ahu ka o ghere oghe, we chua Israel n'azu.
18. Jehova we si Joshua, Zo nkpunkpu ube nke di n'aka-gi n'ebe Ai di; n'ihi na n'aka-gi ka M'gēnye ya. Joshua we zo nkpunkpu ube ahu nke di n'aka-ya n'ebe obodo ahu di.
19. Ndi nēru nbì we si n'ọnọdu-ha bilie ngwa ngwa, we b͕a ọsọ mb͕e o setiri aka-ya, ha we ba n'obodo, were ya; ha we me ngwa sue obodo ahu ọku.
20. Ndikom Ai we le anya n'azu ha, hu, ma, le, anwuru-ọku obodo-ha rigoro rue elu-igwe, ike adighi kwa nime ha ib͕alaga otù uzọ ọzọ: ndi Israel ndi nāb͕alaga n'ọzara we chigharia imegide ndi nāchu ha.
21. Joshua na Israel nile-hukwara na ndi nēru nbì ewerewo obodo ahu, hu kwa na anwuru-ọku obodo arigowo n'elu, ha we laghachi, tib͕ue ndikom Ai.
22. Ndi nēru nbì si kwa n'obodo puta izute ha; ha we nọ n'etiti Israel, ndi si n'ọzara nọ n'otù akuku, ndi si n'obodo nọ kwa n'akuku ọzọ: ha we tib͕ue ha rue mb͕e ọ dighi onye fọduru ma-ọbu onye b͕apuru ab͕apu arapuru ha.
23. Ha we were eze Ai na ndu, me ka ọ biarue Joshua nso.
24. O rue, mb͕e Israel b͕usiri ndi nile bi na Ai n'ọhia, bú n'ọzara ebe ha churu ha, mb͕e ha nile dasiri n'ọnu mma-agha, rue mb͕e ha gwusiri, na Israel nile laghachiri na Ai, ọnu mma-agha tib͕ue ya.
25. Ndi nile ndi dara n'ubọchi ahu, ma nwoke ma nwayi, we di orú nnù madu na nnù iri, bú ndikom nile nke Ai.
26. Ma Joshua eseghachighi aka-ya, nke o ji zo nkpunkpu ube ahu, rue mb͕e o wezugasiri ndi nile bi na Ai ka ebibie ha.