Jọn 12:24-34 Bible Nso (IGBOB)

24. N'ezie, n'ezie, asim unu, Ọ buru na nkpuru ọka adaghi n'ala we nwua, nání ya onwe-ya nānọgide; ma ọ buru na ọ nwuru, ọ mia ọtutu nkpuru.

25. Onye nāhu ndu-ya n'anya nētufu ya; onye nākpọ kwa ndu-ya asì n'uwa nka gēdebe ya rue ndu ebighi-ebi.

26. Ọ buru na onye ọ bula nējerem ozi, ya som; ebe Mu onwem nọ kwa, n'ebe ahu ka onye nējerem ozi gānọ kwa: ọ buru na onye ọ bula nējerem ozi, ya ka Nnam gāsọpuru.

27. Ub͕u a ka nkpuru-obim nālọ miri; gini ka M'gēkwu kwa? Nna, zọputam n'oge hour nka. Ma n'ihi nka ka M'biaruru oge hour nka.

28. Nna, nye aha-Gi otuto. Ya mere otù olu sitere n'elu-igwe da, si, Enyerem ya otuto, M'gēnye kwa Ya otuto ọzọ.

29. Ya mere ìgwè madu ahu, ndi guzoro nso, ndi nu-kwa-ra ya, siri na éb͕è-elu-igwe dara: ndi ọzọ siri, Mọ-ozi agwawo Ya okwu.

30. Jisus zara, si, Ọ bughi n'ihim ka olu a daworo, kama ọ bu n'ihi unu.

31. Ub͕u a ka ikpé uwa nka di: ub͕u a ka agāchupu onye-isi uwa nka.

32. Mu onwem, ọ buru na eweliem elu site n'ala, M'gādọrọ kwa madu nile nye onwem.

33. Ma nka ka O kwuru, nēgosi aha ọnwu Ọ gaje inwu.

34. Ya mere ìgwè madu ahu zara Ya, si, Ayi onwe-ayi nuru site n'iwu-ayi na Kraist-ayi nānọgide rue mb͕e ebighi-ebi: Gì onwe-gi si kwa aṅa si, Aghaghi iweli Nwa nke madu elu? Ònye bu Nwa nke madu a?

Jọn 12