24. Ma ufọdu nime ha ka ezitereri site n'etiti ndi-Farisi.
25. Ha we jua ya, si ya, Ọ̀ bu kwa gini mere i nēme baptism, ma ọ buru na gi onwe-gi abughi Kraist ahu, ma i bughi Elaija, ma i bughi onye-amuma ahu?
26. Jọn zara ha, si, Mu onwem nēji miri me baptism: n'etiti unu ka otù Onye nēguzo Nke unu onwe-unu nāmataghi,
27. bú Onye ahu Nke nābia n'azum, Onye mu onwem nēkwesighi itọpu eriri akpukpọ-ukwu-Ya.
28. Emere ihe ndia na Betani n'ofè Jọdan, ebe Jọn nēme baptism.
29. N'echi-ya ọ hu Jisus ka Ọ nābiakute ya, o we si, Le, Nwa-aturu Chineke, Nke nēbupu nmehie nke uwa!
30. Onye a bu Onye mu onwem kwuru okwu bayere Ya, si, Otù Nwoke nābia n'azum Onye ghọworo Onye burum uzọ: n'ihi na Ọ buri Onye mbu n'ebe m'nọ.
31. Mu onwem amaghi kwa Ya; ma ka eme Ya ka Ọ puta ìhè nye Israel, n'ihi nka ka mu onwem biara nēji miri eme baptism.
32. Jọn we b͕a àmà, si, Ekiriwom Mọ Nsọ ka O si n'elu-igwe nēfeda ka nduru; O we nọgide n'aru Ya.
33. Mu onwem amaghi kwa Ya: ma Onye ziterem ka m'were miri me baptism, Onye ahu sirim, Onye ọ bula i gāhu Mọ Nsọ ka Ọ nēfedakwasi Ya, nānọgide kwa n'aru Ya, Onye ahu bu Onye nēji Mọ Nsọ eme baptism.
34. Mu onwem ahuwo kwa, b͕a kwa àmà na Onye a bu Ọkpara Chineke.
35. Ọzọ n'echi-ya Jọn guzoro, ya na madu abua nime ndi nēso uzọ-ya;
36. o we le Jisus anya ka Ọ nējeghari, ọ si, Le, Nwa-aturu Chineke!
37. Madu abua ahu ndi nēso uzọ-ya we nu ka ọ nēkwu, ha we so Jisus.
38. Jisus we chigharia, kiri ha ka ha nēso Ya, Ọ si ha, Gini ka unu nāchọ? Ha we si Ya, Rabai (nke isi-ya bu, ma asugharia ya, Onye-ozizí), òle ebe I bi?
39. Ọ si ha, Bianu, unu gāhu kwa. Ya mere ha biara hu ebe O biri; ha na Ya we nọgide ubọchi ahu; ọ di ka oge hour nke-iri.
40. Otù nime madu abua ahu ndi nuru okwu si n'ọnu Jọn puta, ndi so-kwa-ra Ya, bu Andru, nwa-nne Saimon.
41. Onye ahu buru uzọ chọta nwa-nne nke aka ya, bú Saimon, si ya, Ayi ahuwo Mesaia-ayi (nke bu, ma asugharia ya, Kraist).
42. O duru ya biakute Jisus. Jisus lere ya anya, si, Gi onwe-gi bu Saimon nwa Jọn: agākpọ gi onwe-gi Kifas (nke bu Pita, ma asugharia ya).