Jeremaia 32:39-43 Bible Nso (IGBOB)

39. M'gēnye kwa ha otù obi na otù uzọ, itu egwu Mu onwem ubọchi nile; ka o we diri ha, di-kwa-ra umu-ha ndi gānọchi ha, nma:

40. Mu na ha gāb͕a kwa ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi, na M'gaghi-esi n'iso ha ime ha nma laghachi azu; ma egwum ka M'gētiye n'obi-ha, ka ha we ghara isi n'ebe M'nọ wezuga onwe-ha.

41. Obi gātọkwam utọ n'aru ha ime ha nma, M'gēji kwa obim nile, ji kwa nkpuru-obim nile, kua ha n'ala nka n'ezie dika osisi.

42. N'ihi na otú a ka Jehova siri: Dika M'meworo ka ihe ọjọ uku a nile biakute ndi nka, otú a ka Mu onwem nēme ka ezi ihe ahu nile biakwasi ha, bú nke Mu onwem nēkwu bayere ha.

43. Agāzú kwa ọhia n'ala nka, nke unu onwe-unu nāsi, Nkpọnkpọ ebe ka ọ bu, nke ọ nādighi madu ma-ọbu anumanu bi nime ya; enyewo ya n'aka ndi Kaldea.

Jeremaia 32