2. si, Nuru okwu Jehova, gi eze Juda, onye nānọkwasi n'oche-eze Devid, gi onwe-gi, na ndi-orù-gi, na ndi-gi ndi nābata n'ọnu-uzọ-ama ndia.
3. Otú a ka Jehova siri: Menu ihe ekpere n'ikpe na ezi omume, naputa-kwa-nu onye anapuworo ihe n'ike n'aka onye-nmeb͕u: unu emejọ-kwa-la ọbìa, ma-ọbu nwa-nb͕ei, ma-ọbu nwanyi di-ya nwuru, unu emela ha ihe-ike, unu awusi-kwa-la ọbara nēmeghi ihe ọjọ n'ebe a.
4. N'ihi na ọ buru na unu eme ihe a n'ezie, ndi-eze ndi nānọchi Devid n'oche-eze-ya gābata kwa n'ọnu-uzọ-ama nke ulo a, bú ndi nānọkwasi n'ub͕ọ-ala na n'inyinya, ya onwe-ya, na ndi-orù-ya, na ndi-ya.
5. Ma ọ buru na unu anughi okwu ndia, ejiwom Onwem ṅu iyi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na nkpọnkpọ ebe ka ulo a gāghọ.
6. N'ihi na ihe di otú a ka Jehova kwuru bayere ulo eze Juda, si: Gilead ka i burum, bú isi Lebanon: ma aghaghm ime gi ka i ghọ ọzara, na obodo nke madu nēbighi.
7. M'gēdo kwa ndi-nbibi nsọ imegide gi, onye ọ bula na ihe-agha-ya: ha gēb͕utu kwa osisi cedar gi nile kachasi nma, me ka ha dakwasi n'ọku.
8. Ọtutu mba gāgabiga kwa n'akuku obodo a, ha gāsirita kwa ibe-ha n'otù n'otù, N'ìhi gini ka Jehova meworo obodo uku a otú a?
9. Ha gāsi kwa, Ọ bu n'ihi na ha rapuru ọb͕ub͕a-ndu nke Jehova, bú Chineke-ha, we kpọ isi ala nye chi ọzọ di iche iche, fè ha.
10. Unu akwalara onye nwuru anwu ákwá, unu egosi-kwa-la ya ebere unu nwere n'aru ya: kwasierenu onye-ije ahu ike; n'ihi na ọ gaghi-alata kwa ọzọ, ọ gaghi-ahu kwa ala amuru ya ọzọ.
11. N'ihi na okwu di otú a ka Jehova kwuru bayere Shalum nwa Josaia, bú eze Juda, nke bu eze n'ọnọdu Josaia, bú nna-ya, nke siri n'ebe a pua, si: Ọ gaghi-alata kwa n'ebe ahu ọzọ;
12. kama n'ebe ahu nke ha mere ya ka ọ je biri, n'ebe ahu ka ọ gānwu, ma ala nka ka ọ nāgaghi-ahu kwa ọzọ.
13. Ahuhu gādiri onye ji ajọ omume ewu ulo-ya, nke ji kwa ikpé nēzighi ezi ewu ime-elu-ya nile; nke nēme ka madu-ibe-ya fè òfùfè n'efu, ọ dighi-enye kwa ya ugwọ-ọlu-ya;
14. onye nāsi, M'gēwuru onwem ulo uku na ime-ulo-elu di iche iche sara mbara, onye nēmere onwe-ya ka window-ya sa mbara; eji kwa osisi cedar machita elu-ya, eji kwa ihe-otite nācha uhie uhie te ya.
15. Ì gābu eze, n'ihi na gi onwe-gi nānu ọku n'obi ika ndi ọzọ n'iji osisi cedar ewu ulo? nna-gi, ò righi ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, me kwa ihe ekpere n'ikpe na ezi omume? mb͕e ahu ka ọ diri ya nma.
16. O kpere ikpe onye ewedara n'ala na ob͕enye; mb͕e ahu ka ọ di nma. Nka abughi imaram? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
17. Ma anya-gi abua na obi-gi adighi n'ihe ọ bula ma-ọbughi nání n'urù nēzighi ezi gi, na n'iwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ, na n'imeb͕u emeb͕u, na n'izọpia-azọpia, ime ya.
18. N'ihi nka ka Jehova ji kwue okwu di otú a bayere Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, si: Ha agaghi-etiri ya aka n'obi, si, Éwù, nwa-nnem nwoke! ma-ọbu, Éwù, nwa-nnem nwanyi! ha agaghi-etiri ya aka n'obi, si, Éwù, onye-nwe-ayi! ma-ọbu, Éwù, ebube-ya!
19. Olìlì nke inyinya-ibu ka agēji lìe ya, agādọrọ ya, tufue ya n'ebe di anya n'azu ọnu-uzọ-ama Jerusalem.