19. Josef we si ha, Unu atula egwu: n'ihi na ọ̀ bu n'ọnọdu Chineke ka m'nọ?
20. Unu onwe-unu kwa, unu chere ihe ọjọ megidem; Chineke chere ya ka ọ buru ezi ihe, ime dika ọ di ta, idebe ọtutu ndi ndu.
21. Ma ub͕u a unu atula egwu: mu onwem ganāzù unu na umu-ntakiri-unu. Ọ we kasie ha obi, gwa ha okwu nāba ha n'obi.
22. Josef we biri n'Ijipt, ya onwe-ya, na ulo nna-ya. Josef we di ndu ọgu arọ ise na iri.
23. Josef we hu umu Efraim nke umu-umu nke-atọ: amu-kwa-ra umu Makia nwa Manase n'ikperè abua nke Josef.
24. Josef we si umu-nne-ya, Mu onwem gaje inwu: ma Chineke gēleta unu n'ezie, me ka unu si n'ala nka rigorue ala ahu nke Ọ ṅuru Abraham na Aisak iyi bayere ya.
25. Josef we me ka umu Israel ṅua iyi, si, Chineke gēleta unu n'ezie, unu gēsi kwa n'ebe a bugo ọkpukpum.
26. Josef we nwua, ọ b͕ara ọgu arọ ise na iri: ha we b͕asì ozu-ya etiye ya n'ib͕e n'Ijipt.