12. Umu-ya ndikom we mere ya otú a dika ọ nyere ha iwu:
13. umu-ya ndikom we bubata ya n'ala Kenean, lìe ya n'ọb͕a nke ọhia Makpila, nke Abraham zutara, ya na ọhia, ka ọ buru ihe-onwunwe nke gābu ala-ílì, n'aka Efron onye-Het, n'iru Mamre.
14. Josef we laghachi n'Ijipt, ya onwe-ya, na umu-nne-ya, na ndi nile soro ya rigo ilì nna-ya, mb͕e o lìsiri nna-ya.
15. Ma mb͕e umu-nne Josef huru na nna-ha anwuruwo, ha si, Eleghi anya Josef gākpọ ayi asì, ọ gēnyeghachi kwa ayi n'ùjú ihe ọjọ nile ayi mere ya.
16. Ha we nye otù onye iwu n'ebe Josef nọ, si, Nna-gi nyere iwu tutu ọnwu-ya, si,
17. Otú a ka unu gāsi Josef, Ariọm i, biko, b͕aghara njehie umu-nne-gi, na nmehie-ha, n'ihi na ọ bu ihe ọjọ ka ha meworo gi: ub͕u a kwa, biko, b͕aghara njehie ndi-orù Chineke nke nna-gi. Josef we kwa ákwá mb͕e ha gwara ya okwu.
18. Umu-nne-ya we je kwa, da n'ala n'iru ya, si, Le, ayi gāburu gi ndi-orù.
19. Josef we si ha, Unu atula egwu: n'ihi na ọ̀ bu n'ọnọdu Chineke ka m'nọ?
20. Unu onwe-unu kwa, unu chere ihe ọjọ megidem; Chineke chere ya ka ọ buru ezi ihe, ime dika ọ di ta, idebe ọtutu ndi ndu.
21. Ma ub͕u a unu atula egwu: mu onwem ganāzù unu na umu-ntakiri-unu. Ọ we kasie ha obi, gwa ha okwu nāba ha n'obi.
22. Josef we biri n'Ijipt, ya onwe-ya, na ulo nna-ya. Josef we di ndu ọgu arọ ise na iri.
23. Josef we hu umu Efraim nke umu-umu nke-atọ: amu-kwa-ra umu Makia nwa Manase n'ikperè abua nke Josef.
24. Josef we si umu-nne-ya, Mu onwem gaje inwu: ma Chineke gēleta unu n'ezie, me ka unu si n'ala nka rigorue ala ahu nke Ọ ṅuru Abraham na Aisak iyi bayere ya.