1. Ma ndia bu osuso-ọmumu Isọ (nke ahu bu Edom).
2. Isọ luru ndinyom-ya site n'umu-ndinyom Kenean; Eda nwa-nwayi Ilon onye Het, na Ọhọlibama nwa-nwayi Ana, bú nwa-nnanyi Zibeon onye-Haivait;
3. na Basemat nwa-nwayi Ishmael, nwa-nne-nwayi Nebaiot.
4. Eda we muara Isọ Elifaz; Basemat mukwara Reuel;