33. Leban we ba n'ulo-ikwū Jekob, na n'ulo-ikwū Lia, na n'ulo-ikwū orù-ndinyom abua; ma ọ chọtaghi ha. Ọ we si n'ulo-ikwū Lia pua, ba n'ulo-ikwū Rechel.
34. Ma Rechel wereri teraphim ahu, tinye ha nime ihe eji anọkwasi camel, we nọkwasi ha. Leban we bitu ulo-ikwū ahu nile aka, ma ọ chọtaghi ha.
35. Rechel we si nna-ya, Ya abula ihe iwe iwe di ọku n'anya onye-nwem na apughm ibili n'iru gi; n'ihi na ọ dim dika ọ nādi ndinyom. Ọ we chọsie ike, ma ọ chọtaghi teraphim ahu.
36. Jekob we we iwe di ọku, so Leban se okwu: Jekob we za, si Leban, Gini bu njehiem? gini bu nmehiem, na i chuworom n'ọku ọku?