32. Onye ọ bula i gāchọta chi-gi-hà n'aka-ya, ọ gaghi-adi ndu: n'iru umu-nne-ayi mata ihe nke gi di n'akam, were n'onwe-gi. N'ihi na Jekob amaghi na Rechel zuru ha-ri ori.
33. Leban we ba n'ulo-ikwū Jekob, na n'ulo-ikwū Lia, na n'ulo-ikwū orù-ndinyom abua; ma ọ chọtaghi ha. Ọ we si n'ulo-ikwū Lia pua, ba n'ulo-ikwū Rechel.
34. Ma Rechel wereri teraphim ahu, tinye ha nime ihe eji anọkwasi camel, we nọkwasi ha. Leban we bitu ulo-ikwū ahu nile aka, ma ọ chọtaghi ha.