Ilu 28:20-27 Bible Nso (IGBOB)

20. Onye ọ bula nke kwesiri ntukwasi-obi gēnwe ọtutu ngọzi:Ma onye nānukpọ onwe-ya ibu ọgaranya, agaghi-agu ya n'onye nēmeghi ihe ọjọ.

21. Imata iru madu n'ikpé adighi nma:Ọ dighi kwa nma ka madu ji n'ihi iberibe nri nējehie.

22. Onye nāb͕aso àkù ka onye nwere anya ọjọ bu,Ma ọ maghi na ihe-ukọ gābiakute ya.

23. Onye nābara madu nba gēmesia huta amaraKari onye nēkwu ire-utọ.

24. Onye nānapu nna-ya ma-ọbu nne-ya ihe n'ike, si, Ọ dighi njehie ọ bu;Onye ejikọtaworo ya na onye-nbibi ka ọ bu.

25. Onye nkpuru-obi-ya di nganga nākpali ise-okwu:Ma onye nātukwasi Jehova obi, agēme, ya ka ọ ma abuba.

26. Onye nātukwasi obi n'obi nke aka ya, onye ahu bu onye-nzuzu:Ma onye nēje ije n'amam-ihe, onye ahu ka agēme ka o wepuga onwe-ya.

27. Onye nēnye ob͕eye ihe, ihe adighi-akọ ya:Ma onye nēzobe anya-ya abua, agābu ya ọtutu ọnu.

Ilu 28