Ilu 28:1-17 Bible Nso (IGBOB)

1. Ndi nēmebi iwu ab͕alagawo mb͕e ọ dighi onye nāchu ha:Ma ndi ezi omume nwere ntukwasi-obi dika ọdum.

2. N'ihi njehie nke ala ha di ọtutu, bú ndi-isi-ya:Ma site na madu nwere nghọta na ihe-ọmuma ka ọnọdu-ya gādigide ogologo mb͕e.

3. Nwoke bu ob͕eye nke nēmeb͕u ndi nēnweghi ike,Ọ di ka miri-ozuzo nke nāzachapu ihe, nri we ghara idi.

4. Ndi nārapu iwu nēto onye nēmebi iwu,Ma ndi nēdebe iwu nāluso ha ọ̀gù.

5. Ndi ọjọ adighi-aghọta ikpé:Ma ndi nāchọ Jehova nāghọta ihe nile.

6. Ọ di nma, bú ob͕eye nke nēje ije n'izu-okè-ya,Kari onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uzọ-ya abua, ọ bu ezie na onye ahu bu ọgaranya.

7. Onye nēdebe iwu bu nwa nāghọta ihe:Ma onye bu eyì ndi nēribiga ihe ókè nētiye nna-ya n'onọdu-ihere.

8. Onye nēme ka àkù-ya ba uba site n'inara uma na ọmuru-nwa,Ọ nēkpokọta ya nye onye nēmere ndi nēnweghi ike amara.

9. Onye nēwezuga nti-ya n'inu iwu,Ọbuná ekpere-ya bu ihe-árú.

10. Onye nēme ka ndi ziri ezi waghari n'uzọ ọjọ,N'olùlù nke aka ya ka ya onwe-ya gādabà:Ma ndi zuru okè gēketa ezi ihe.

11. Onye mara ihe n'anya-ya ka ọgaranya bu;Ma onye nēnweghi ike nke nāghọta ihe nēgwuputa ala-ya.

12. Mb͕e obi ndi ezi omume nātọ ha utọ, ọtutu ima-nma di:Ma mb͕e ndi nēmebi iwu nēbili, agāchọ madu achọ.

13. Onye nēkpuchi njehie-ya nile, ọ gaghi-agara ya:Ma onye nēkwuputa ha, nke nārapu kwa ha, agēnwe obi-ebere n'aru ya.

14. Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu nke nātu oké egwu mb͕e nile:Ma onye nēme ka obi-ya sie ike gādabà n'ihe ọjọ.

15. Ọdum nke nāb͕o uja na anu-ọhia bear nke nāb͕aghariKa onye nēmebi iwu nke nāchi ndi nēnweghi ike bu.

16. Gi onye-ndú nke nghọta kọrọ, nke bu kwa onye-nmeb͕u uku,Onye nākpọ urù nēzighi ezi asì gēme ka ubọchi-ya nile di ogologo.

17. Madu nke ọbara madu nānyib͕u,Rue olùlù ka ọ gāb͕alaga; ka onye ọ bula ghara ijide ya.

Ilu 28