1. Okwu Jehova we ruem nti, si,
2. Nwa nke madu, bue amuma, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Kwasienu ákwá ike, si, Azib͕a ub͕ochi ahu!
3. N'ihi na ubọchi di nso, ọ di nso, bú ubọchi Jehova nwere, ọ bu ubọchi igwe-oji; mb͕e nke mba di iche iche ka ọ gābu.
4. Mma-agha gābiakwasi kwa n'Ijipt, ihe-nb͕ali gādi kwa n'Etiopia, mb͕e ndi eb͕uru eb͕u gāda n'Ijipt; ha ewe chipu ìgwè ndi-ya, kwatue ntọ-ala-ya nile.
5. Etiopia, na Put, na Lud, na ndi nile gwara ọgwa, na Kub, na umu nke ala nke ọb͕ub͕a-ndu ahu, gēso ha da site na mma-agha.
6. Otú a ka Jehova siri: Ndi nākwagide Ijipt gāda kwa, npako nke ike-ya gārida kwa: site na Migdol rue Sevene, ọ bu site na mma-agha ka ha gāda nime ya; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
7. Ha gātọb͕ọrọ kwa n'efu n'etiti ala nile nke tọb͕ọrọ n'efu, obodo-ya nile gādi kwa n'etiti obodo nile nke bu nkpọnkpọ.
8. Ha gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'tiyesiri ọku n'Ijipt, na mb͕e etijisiri ndi nile nēyere ya aka.
9. N'ubọchi ahu ndi-ozi gēsi n'irum pua je n'ub͕ọ di iche iche ime ka Etiopia ma jijiji, bú ndi nọ na ntukwasi-obi; ihe-nb͕ali gādi kwa n'aru ha, dika n'ubọchi Ijipt, n'ihi na, le, ọ nābia.
10. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: M'gēme kwa ka ìgwè ndi Ijipt kwusi, n'aka Nebukadreza, bú eze Babilon.
11. Ya onwe-ya na ndi-ya so ya, bú ndi kachasi mba nile n'ime ka madu ma jijiji, agaje ime ka ha bata ibibi ala ahu; ha gāmiputa kwa mma-agha-ha imegide Ijipt, ha gēmeju kwa ala ahu na ndi eb͕uru eb͕u.
12. M'gēme kwa ka osimiri Nail nile ghọ ebe kpọrọ nku, M'gēre kwa ala ahu n'aka ndi ọjọ, me ka ala ahu na ùjú-ya tọb͕ọrọ n'efu, site n'aka ndi ala ọzọ: Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu.