Ezikiel 19:1-10 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma gi onwe-gi, buliere ndi-isi Israel abù-ákwá,

2. si, Gini ka nne-gi bu? Ọ bu nne-ọdum: n'etiti ọdum ka ọ makpuru, n'etiti umu-ọdum ka o mere ka umu-ya ba uba.

3. O we zùputa otù n'umu-ya; nwa-ọdum ka ọ ghọrọ: o we muta idọb͕u anu-ndọb͕u, madu ka o riri.

4. Mba di iche iche we nu ihe bayere ya; n'olùlù-ha ka anwudere ya: ha ji nb͕a-aka-imi me ka ọ biarue ala Ijipt.

5. Nne-ọdum ahu we hu na o chereri, ma na olile-anya-ya alawo n'iyì, o we were otù ọzọ n'umu-ya, me ya nwa-ọdum.

6. Nwa-ọdum ahu we jegharia n'etiti ọdum, nwa-ọdum ka ọ ghọrọ: o we muta idọb͕u anu-ndọb͕u, madu ka o riri.

7. O we mata ulo ọma nile nke ala ahu, ọ bu kwa obodo nile ha ka o mere nkpọnkpọ ebe; ala ahu na ùjú-ya we tọb͕ọrọ n'efu, site n'olu nke nbib͕ọ-ya.

8. Mba nile we si n'ala nile anāchi achi megide ya buruburu: ha we b͕asa ub͕u-ha n'aru ya; n'olùlù-ha ka anwudere ya.

9. Ha we tiye ya n'ulo-nmechibido na nb͕a-aka-imi, me ka ọ biakute eze Babilon; ha nēme ka ọ ba n'ebe ewusiri ike, ka ewe ghara inu kwa olu-ya ọzọ n'ugwu nile nke Israel.

10. Nne-gi di ka osisi vine, n'ọbara-gi, n'akuku miri ka akuworo ya: osisi nke nāmi nkpuru nke juputa-kwa-ra na ngalaba ka ọ bu site n'ọtutu miri.

Ezikiel 19