19. Amam-ihe nēme ka onye mara ihe di ike kari madu iri ndi nāchi achi ndi nọ n'obodo.
20. N'ezie ọ dighi onye ezi omume n'uwa, nke nēme ezi ihe, nādighi-emehie kwa.
21. Ọzọ, atukwasila obi-gi n'okwu nile anēkwu; ka i we ghara inu ka orù-gi nākọcha gi:
22. N'ihi na ọtutu mb͕e obi-gi maworo na gi onwe-gi akọchawo ndi ọzọ.
23. Ihe nile a ka m'nwaworo n'amam-ihe: m'siri, M'gāma ihe; ma nke ahu di anya n'ebe m'nọ.
24. Ọ di anya, bú ihe nke diworo, o mi-kwa-ra emi nke-uku; ònye gāchọputa ya?
25. M'chighariri, mu onwem na obim, ima na iledo, na ichọsi amam-ihe na ichè-èchìchè ike, na ima na nmebi-iwu bu nzuzu, ima kwa na nzuzu bu iwi-ara: