1. Nka bu kwa ngọzi ahu, nke Moses, bú onye nke Chineke, gọziri umu Israel tutu ọnwu-ya.
2. Ọ we si,Jehova siri na Sainai bia,Si kwa na Sia walitere ha;O siri n'ugwu Peran nwuputa,O si-kwa-ra na ndi nsọ anāpughi iguta ọnu bia:Ọku di n'aka-nri-Ya, bú iwu enyere ha.
3. E, Ọ nāhu ndi nke Ya nile n'anya;Ndi nsọ Ya nile di n'aka-gi:Ndi ahu we nọdu ala n'ukwu-gi;Onye ọ bula gānata ufọdu nime okwu-gi.
4. Iwu ka Moses nyere ayi,Bú ihe-nnweta nke nkpọkọta Jekob.
5. Ọ we buru eze nime Jeshurun,Mb͕e ndi-isi ndi Israel chikọtara onwe ha,Ebo nile nke Israel n'otù.
6. Ka Reuben di ndu, ghara kwa inwu;Ma ka ndikom-ya di ole-na-ole.
7. Nka bu kwa ngọzi nke Juda: ọ we si,Jehova, nu olu Juda,Me kwa ka ọ bakute ndi-ya:Aka-ya abua aluworo ya onwe-ya ọ̀gù;Onye-iye-aka megide ndi nākpab͕u ya ka I gābu.
8. Ọ we kwue ihe bayere Livai, si,Izu-okè-Gi na Ìhè-Gi diri onye-ebere-Gi,Onye I nwara na Masa,Onye Gi na ya nēse okwu n'akuku miri Meriba;
9. Onye ahu nke nēkwu okwu bayere nna-ya, baye-kwa-ra nne-ya, si, Ahughm ya;Umu-nne-ya ka ọ nāmataghi kwa;Umu-ya ka ọ nāmaghi kwa;N'ihi na ha edebewo okwu-ọnu-Gi,Ọb͕ub͕a-ndu-Gi ka ha nēchezi kwa.