Deuteronomi 32:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Ṅanu nti, unu elu-igwe, ka m'kwu kwa ihe;Ka uwa nu kwa okwu ọnum:

2. Nmutam gātasi dika miri-ozuzo,Okwu-ọnum ganēruputa dika igirigi;Dika nshansha-miri n'elu ahihia ndu,Di kwa ka oké miri-ozuzo n'elu ihe-ọkukú:

3. N'ihi na aha Jehova ka m'gākpọsa:Nyenu Chineke-ayi idi-uku.

4. Oké nkume ahu, ihe zuru okè ka ọlu-Ya bu:N'ihi na uzọ-Ya nile bu ikpé ziri ezi:Chineke Nke kwesiri ntukwasi-obi, Nke nēnweghi ajọ omume,Onye ezi omume na onye ziri ezi ka Ọ bu.

5. Ha ebibiwo onwe-ha, ọ bughi nke umu-Ya ka ọlu nke di ha n'aru bu.Ha bu ọb͕ọ b͕agọrọ ab͕agọ nke rọ-kwa-ra arọ.

6. Ùnu nēnyeghachi Jehova otú a,Unu ndi-nzuzu ndi nāmaghi ihe?Ọ̀ bughi ya onwe-ya bu nna-gi onye nwetaworo gi?Ya onwe-ya emewo gi, me kwa ka i guzosie ike.

Deuteronomi 32