Abù Ọma 68:25-34 Bible Nso (IGBOB)

25. Ndi-abù buru uzọ ga, ndi-ubọ-akwara soro n'azu,N'etiti umu-ab͕ọghọ ndi nēti egwú-otiti.

26. Nime nkpọkọta nile nke madu gọzienu Chineke,Bú Onye-nwe-ayi, unu ndi sitere n'isi-iyi Israel.

27. N'ebe ahu ka ọ nọ, bú Benjamin di ntà, nke nwere ike n'aru ha,Ya na ndi-isi Juda na ìgwè ndi-ha,Na ndi-isi Zebulum, na ndi-isi Naftali.

28. Chineke-gi enyewo ike-gi iwu:Di ike, Chineke, Gi Onye luworo ayi ọlu.

29. N'ihi ulo uku Gi nime JerusalemỌ bu Gi ka ndi-eze gēdukuru ùtú.

30. Basiere anu-ọhia nke amì nba ike,Ìgwè oke-ehi, ha na umu-ehi nke ndi nile di iche iche,Onye ọ bula nime ha nēkwe ka azọtọ ya n'ukwu nēweta iberibe ọla-ọcha;Ọ chusawo ndi nile di iche iche ndi ilu-ọ̀gù nātọ utọ.

31. Ndi amara aha-ha gēsi n'Ijipt puta;Etiopia gēsetiri Chineke aka-ya abua ngwa ngwa.

32. Unu ala-eze nke uwa, bùkuenu Chineke abù;Bùkuenu Onye-nwe-ayi abù ọma; Selah

33. Bùkuenu Onye ahu Nke elu-igwe kachasi elu-igwe nile, nke di mb͕e ochie, nēbu dika inyinya;Le, Ọ nēme ka olu-Ya da udà, ọ bu olu ike.

34. Nyenu Chineke ike:N'elu Israel ka idi-elu-Ya di,Ike-ya di kwa na mbara-ígwé nile.

Abù Ọma 68