18. I rigoruwo n'ebe di elu; dọta usu ndi adọtara n'agha n'agha;I natawo onyinye di iche iche n'etiti madu,E, ọbuná n'etiti ndi nēwezuga onwe-ha, ka Ja, bú Chineke, we biri n'etiti ha.
19. Onye agọziri agọzi ka Onye-nwe-ayi bu, kwa-ubọchi ka Ọ nēburu ayi ibu,Bú Chineke Nke bu nzọputa-ayi. Selah
20. Chineke buru ayi Chineke nāzọputa azọputa;Ọ bu kwa Johova, bú Onye-nwe-ayi, nwe uzọ nile isi n'ọnwu pua.
21. Ọ bu nání na Chineke gēb͕upú isi ndi-iro-Ya,Bú opu-n'isi arapuru ndundu nke onye nējeghari n'ikpe-ọmuma-ya.
22. Onye-nwe-ayi siri, M'gēme ka ha si na Beshan lata,M'gēme ka ha si n'ebe nile di omimi nke oké osimiri lata:
23. Ka I we b͕aye ukwu-gi n'ọbara,Ka ire nkita-gi nile we si n'aru ndi-iro-gi kère òkè-ya.
24. Ha ahuwo ojije-Gi nile, Chineke,Bú ojije nile nke Chinekem, bú Ezem, n'idi-nsọ-Ya.
25. Ndi-abù buru uzọ ga, ndi-ubọ-akwara soro n'azu,N'etiti umu-ab͕ọghọ ndi nēti egwú-otiti.
26. Nime nkpọkọta nile nke madu gọzienu Chineke,Bú Onye-nwe-ayi, unu ndi sitere n'isi-iyi Israel.
27. N'ebe ahu ka ọ nọ, bú Benjamin di ntà, nke nwere ike n'aru ha,Ya na ndi-isi Juda na ìgwè ndi-ha,Na ndi-isi Zebulum, na ndi-isi Naftali.
28. Chineke-gi enyewo ike-gi iwu:Di ike, Chineke, Gi Onye luworo ayi ọlu.
29. N'ihi ulo uku Gi nime JerusalemỌ bu Gi ka ndi-eze gēdukuru ùtú.