24. Joab we biakute eze, si, Gini ka i meworo? le, Abnea biakutere gi; n'ìhi gini ka nka bu, na i zilagawo ya, o we lasia?
25. I mawo Abnea nwa Nea, na ọ bu irafu gi ka ọ biara, ya na imara ọpupu-gi na nbata-gi, na imata ihe nile nke gi onwe-gi nēme.
26. Joab we si n'ebe Devid nọ puta, ziga ndi-ozi n'azu Abnea, ha we me ka o si n'olùlù-miri Saira biaghachi: ma Devid amaghi.
27. Abnea we laghachi rue Hebron, Joab we wezuga ya n'etiti ọnu-uzọ-ama ikpayere ya uka na nwayọ, o we tie ya n'okpuru ọgiriga-ya nke-ise n'ebe ahu, o we nwua n'ihi ọbara Asahel, bú nwa-nne-ya.
28. Devid we nu nke a mgbe emesiri, ọ si, Ndi puworo n'ọbara Abnea nwa Nea n'iru Jehova rue mb͕e ebighi-ebi ka mu na ala-ezem bu:
29. ka ọ dakwasi n'isi Joab, na n'ulo nna-ya nile; ka aghara kwa ibipu n'ulo Joab onye nwere orùrù n'anu-aru-ya, ma-ọbu onye-ekpenta, ma-ọbu onye nādabere na nkpa-n'aka, ma-ọbu onye nāda site na mma-agha, ma-ọbu onye nri kọrọ.
30. Ma Joab na Abishai, bú nwa-nne-ya, b͕uru Abnea, n'ihi na o mere ka nwa-nne-ha, bú Asahel, nwua nime Gibeon n'agha ahu.
31. Devid we si Joab, si kwa ndi nile ya na ha nọ, Dọwanu uwe-unu, ke ákwà-nkpe n'úkwù-unu, tie aka n'obi n'iru Abnea. Eze, bú Devid, nējeso kwa ihe eji ebu ozu.
32. Ha we lìe Abnea nime Hebron: eze we welie olu-ya kwa ákwà n'ílì Abnea; ndi Israel nile we kwa ákwà.
33. Eze we bùara Abnea abù-ákwà, si,Ọ̀ bu dika onye-nzuzu nānwu ka Abnea gānwu?
34. Ekeghi aka-gi abua ab͕u, emeghi kwa ka ukwu-gi abua biarue nso ihe ọla eji ke ukwu ab͕u:Dika onye nāda n'iru ndi ajọ omume, otú a ka i dara.Ndi Israel nile we kwara ya ákwá ọzọ.
35. Ndi ahu nile we bia ime ka Devid rie nri mb͕e ubọchi fọduru; ma Devid ṅuru iyi, si, Chineke mem otú a, me kwa ihe ọzọ otú a, ọ buru na edetum nri ọnu, ma-ọbu ihe ọ bula ọzọ, tutu ọdida-anyanwu.
36. Ndi-ya nile we mata, ọ di nma n'anya-ha: dika ihe ọ bula eze mere di nma n'anya ndi-ya nile.
37. Ndi-ya nile na Israel nile we mara n'ubọchi ahu na o siteghi n'aka eze ime ka Abnea nwa Nea nwua.
38. Eze we si ndi-orù-ya, Únu amaghi na onye-isi na onye uku adawo n'Israel ta?