24. Joab we biakute eze, si, Gini ka i meworo? le, Abnea biakutere gi; n'ìhi gini ka nka bu, na i zilagawo ya, o we lasia?
25. I mawo Abnea nwa Nea, na ọ bu irafu gi ka ọ biara, ya na imara ọpupu-gi na nbata-gi, na imata ihe nile nke gi onwe-gi nēme.
26. Joab we si n'ebe Devid nọ puta, ziga ndi-ozi n'azu Abnea, ha we me ka o si n'olùlù-miri Saira biaghachi: ma Devid amaghi.
27. Abnea we laghachi rue Hebron, Joab we wezuga ya n'etiti ọnu-uzọ-ama ikpayere ya uka na nwayọ, o we tie ya n'okpuru ọgiriga-ya nke-ise n'ebe ahu, o we nwua n'ihi ọbara Asahel, bú nwa-nne-ya.
28. Devid we nu nke a mgbe emesiri, ọ si, Ndi puworo n'ọbara Abnea nwa Nea n'iru Jehova rue mb͕e ebighi-ebi ka mu na ala-ezem bu:
29. ka ọ dakwasi n'isi Joab, na n'ulo nna-ya nile; ka aghara kwa ibipu n'ulo Joab onye nwere orùrù n'anu-aru-ya, ma-ọbu onye-ekpenta, ma-ọbu onye nādabere na nkpa-n'aka, ma-ọbu onye nāda site na mma-agha, ma-ọbu onye nri kọrọ.
30. Ma Joab na Abishai, bú nwa-nne-ya, b͕uru Abnea, n'ihi na o mere ka nwa-nne-ha, bú Asahel, nwua nime Gibeon n'agha ahu.
31. Devid we si Joab, si kwa ndi nile ya na ha nọ, Dọwanu uwe-unu, ke ákwà-nkpe n'úkwù-unu, tie aka n'obi n'iru Abnea. Eze, bú Devid, nējeso kwa ihe eji ebu ozu.