2. Samuel 20:4-18 Bible Nso (IGBOB)

4. Eze we si Amasa, Kpọkọtaram ndikom Juda n'ubọchi atọ, gi onwe-gi guzo kwa n'ebe a.

5. Amasa we je ikpọkọta Juda: ma ọ nọrọ ọdù kari mb͕e akara àkà nke ọ kaworo ya.

6. Devid we si Abishai, Ub͕u a Sheba nwa Bikri gēmejọ ayi kari Absalom: gi onwe-gi chiri ndi-orù onye-mwe-gi, chua ya n'azu, ka o we ghara ichọtara onwe-ya obodo ufọdu ewusiri ike, we naputa onwe-ya n'anya-ayi.

7. Ndikom Joab we soro ya pua, ha na ndi Keret na ndi Pelet, na ndi-dike nile: ha we si na Jerusalem pua, ichu Sheba nwa Bikri n'azu.

8. Mb͕e ndi ahu nọ n'akuku nkume uku nke di na Gibeon, Amasa biara n'iru ha. Ma ekeworo Joab ihe-ọkiké, uwe-nwuda-ya ka o yikwasiri, ihe-ọkiké di kwa n'elu ya, ya na mma-agha ekekọtara n'úkwù-ya n'ọbọ-ya; ma mb͕e Joab putara mma-agha we dapu.

9. Joab we si Amasa, Ọ̀ bu n'udo ka i nọ, nwa-nnem? Joab we were aka-nri-ya jide Amasa n'afu-ọnu isutu ya ọnu.

10. Ma Amasa elezighi anya na mma-agha nke di n'aka Joab: o we were ya tie ya n'okpuru ọgiriga nke-ise, wusi ngiri-afọ-ya n'ala, ma o tighi kwa ya ọzọ; o we nwua. Joab na Abishai, bú nwa-nne-ya, we chua Sheba nwa Bikri n'azu.

11. Ma otù nwoke n'etiti umu-okorọbia Joab guzoro n'akuku ya, si, Onye ọ bula ihe Joab nātọ utọ, na onye ọ bula diri Devid, ya so Joab n'azu.

12. Ma Amasa nāturu n'ọbara n'etiti uzọ atuliri atuli. Nwoke ahu we hu na ndi Israel nile guzoro, o we bupu Amasa n'uzọ atuliri atuli chigharia n'ọhia, tukwasi uwe n'elu ya, mb͕e ọ huru na onye ọ bula nke biara n'ebe ọ di guzoro.

13. Mb͕e ebupusiri ya n'uzọ atuliri atuli, ndikom nile gabigara iso n'azu Joab, ichu Sheba nwa Bikri n'azu.

14. O we gabiga n'ebo nile nke Israel rue Ebel, na Bet-meaka, na ndi Bia nile: ewe kpọkọta ha, ha we bia so kwa ya n'azu.

15. Ha we bia nọchigide ya n'agha n'Ebel Bet-meaka, wukọta ihe-ntukọba imegide obodo ahu, o we guzo nime ékpè: ndi nile soro Joab nēbibimb͕idi, ime ka ọ da.

16. Otù nwayi nke mara ihe we si n'obodo ahu kpọ òkù, si, Nurunu, nurunu; biko, sinu Joab, Biarue nso n'ebe a, ka m'gwa gi okwu.

17. O we biarue ya nso; nwayi ahu we si, Gì onwe-gi bu Joab? Ọ si, Mu onwem bu ya. Nwayi ahu we si ya, Nuru okwu nile nke orù-gi nwayi. Ọ si Anamanu nọ̄.

18. Nwayi ahu we kwue, si, Ha nēkwu ekwu na mbu, si, Ha aghaghi iju ase n'Ebel: otú a ka ha kwuzu-kwa-ra okwu.

2. Samuel 20