2. Samuel 19:19-33 Bible Nso (IGBOB)

19. Ọ si eze, Ka onye-nwem ghara igu ajọ omume nyem, echeta-kwa-la ihe orù-gi mere n'ajọ omume n'ubọchi onye-nwem, bú eze, siri na Jerusalem pua, ka eze we tiye ya n'obi-ya.

20. N'ihi na orù-gi amawo na mu onwem emehiewo: ma, le, abiawom ta, buru ulo nile nke Josef uzọ irida izute onye-nwem, bú eze.

21. Abishai nwa Zeruaia we za, si, Àgaghi-eme ka Shimai nwua n'ihi nka, n'ihi na ọ kọchara onye Jehova etere manu?

22. Devid we si, Gini ka mu na unu nwekọrọ, umu-ndikom Zeruaia, na unu gāburum onye-nmegide ta? àgēme ka nwoke ọ bula nwua n'Israel ta? n'ihi na ọ̀ bu na amaghm na ta ka mu onwem bu eze Israel?

23. Eze we si Shimai, I gaghi-anwu. Eze we ṅuara ya iyi.

24. Mefiboshet nwa Sọl rida-kwa-ra izute eze; ma o dozighi ukwu-ya, o dozighi kwa afu-ọnu-ya, ọ sughi kwa uwe-ya miri, site n'ubọchi eze jere rue ubọchi mb͕e ọ bia-kwa-ra n'udo.

25. O rue, mb͕e ọ biaruru Jerusalem izute eze, na eze siri ya, N'ìhi gini ka i nēsoghm je, Mefiboshet?

26. Ọ si, Onye-nwem, eze, orùm ghọb͕urum: n'ihi na orù-gi siri, Ka m'jikwara onwem inyinya-ibu, ka m'we nọkwasi ya, soro eze je; n'ihi na orù-gi dara ngwurọ.

27. O we kwulu orù-gi n'ebe onye-nwem, bú eze, nọ; ma onye-nwem, bú eze, di ka onye-ozi Chineke: gi me kwa ihe di nma n'anya-gi.

28. N'ihi na ulo nnam nile abughi ihe ọ bula ma-ọbughi ndi ọnwu n'iru onye-nwem, bú eze: ma i doro orù-gi n'etiti ndi nēri ihe na table nke gi. Ma èzi omume gini ka m'nwere ọzọ itiku eze nkpu ọzọ?

29. Eze we si ya, N'ìhi gini ka i nēkwu okwu bayere okwu-gi nile ọzọ? Asiwom, Gi onwe-gi na Ziba gēkè ubi ahu.

30. Mefiboshet we si eze, E, ya were ihe nile, ebe onye-nwem, bú eze, biaworo n'ulo-ya n'udo.

31. Bazilai, bú onye Gilead, we si na Rogelim rida; o we soro eze gabiga Jọdan, izilaga ya n'ofè Jọdan.

32. Ma Bazilai mere agadi nke-uku, ọ b͕ara ọgu arọ anọ: ya onwe-ya zù-kwa-ra eze mb͕e ọ nānọdu na Mahanaim; n'ihi na oké madu ka ọ bu nke-uku.

33. Eze we si Bazilai, Gi onwe-gi sorom gabiga, m'gāzù kwa gi n'ebe m'nọ na Jerusalem.

2. Samuel 19