2. Ndi-Eze 8:3-10 Bible Nso (IGBOB)

3. O rue, n'ọgwugwu arọ asa ahu, na nwayi ahu si n'ala ndi Filistia lata: ọ pua itiku eze nkpu bayere ulo-ya na ala-ya.

4. Ma eze nāgwa Gihezi, bú nwa-okorọbia onye nke Chineke, okwu, si, Biko, kọrọm akukọ ihe uku nile nke Elaisha meworo.

5. O rue na, mb͕e ya onwe-ya nākọrọ eze otú o mere ka onye nwuru anwu di ndu ọzọ, le, nwayi ahu, onye o mere ka nwa-ya nwoke di ndu ọzọ nētiku eze nkpu bayere ulo-ya, baye-kwa-ra ala-ya. Gihezi we si, Onye-nwem eze, nka bu nwayi ahu, nka bu kwa nwa-ya nwoke, onye Elaisha mere ka ọ di ndu ọzọ.

6. Eze we jua nwayi ahu, o we kọrọ ya akukọ ahu. Eze we nye ya otù onye nējere ya ozi, si, Nyeghachi ihe nile o nwere, na ihe-ọmume nile nke ubi site n'ubọchi ọ rapuru ala-ya, we rue ub͕u a.

7. Elaisha we biarue Damaskọs; ma Ben-hedad, bú eze Siria, nāria ọria; ewe gosi ya, si, Onye nke Chineke abiawo n'ebe a.

8. Eze we si Hazael, Were onyinye-inata-iru-ọma n'aka-gi, je izute onye nke Chineke, jua Jehova ase site n'aka-ya, si, M'gādiri ndu n'ọria nka?

9. Hazael we je izute ya, were onyinye-inata-iru-ọma n'aka-ya, bú ezi ihe nile nke Damaskọs, ibu ọgu camel abua gēbu, o we bia guzo n'iru ya, si, Nwa-gi, bú Ben-hedad eze Siria, ezìwom biakute gi, si, M'gādiri n'ọria nka?

10. Elaisha we si ya, Je, si ya, I ghaghi idiri ndu; ma Jehova emewo ka m'hu na ọ ghaghi inwu.

2. Ndi-Eze 8