2. Ndi-Eze 4:30-38 Bible Nso (IGBOB)

30. Nne nwa-okoro ahu we si, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, m'gaghi-arapu gi ma-ọli. O we bilie, jeso ya.

31. Gihezi we gabiga n'iru ha, tukwasi nkpa-n'aka ahu n'iru nwa-okoro ahu; ma ọ dighi olu di, ọ dighi kwa ọṅuṅa-nti di. O we jeghachi izute ya, gosi ya, si, Nwa-okoro ahu etetaghi.

32. Elaisha we bata n'ulo ahu, ma, le, nwa-okoro ahu anwuwo, atọb͕ọ-kwa-ra ya n'ihe-ndina-ya.

33. O we ba, mechibido ha abua uzọ kpere Jehova.

34. Ọ rigo, dina n'elu nwata ahu, tukwasi ọnu-ya n'ọnu-ya, na anya-ya abua n'anya-ya abua, na ọbu-aka-ya abua n'ọbu-aka-ya abua, ruru ala n'elu ya: anu-aru nwata ahu we di ọku.

35. O we biaghachi, jegharia iru na azu n'ulo otù ub͕ò; ọ rigo, ruru kwa n'elu ya: nwa-okoro ahu we ze uzere rue ub͕ò asa, nwa-okoro we saghe anya-ya abua.

36. Ọ kpọ Gihezi, si, Kpọ nwayi Shunem nka. Ọ kpọ ya. Nwayi ahu we bakute ya, ọ si, Kuru nwa-gi.

37. O we ba nime, da n'ala n'ukwu-ya, kpọ isi ala, kuru nwa-ya, pua.

38. Ma Elaisha biaghachiri rue Gilgal: ma oké unwu di n'ala ahu; umu ndi-amuma nānọdu kwa ala n'iru ya: o we si nwa-okorọbia-ya, Tukwasi ite uku n'ọku, siere umu ndi-amuma ofé.

2. Ndi-Eze 4